Ènwè Anarala Nwaanyị Nwa Ya Ebe Ọ Na-Enye Ya Ara, Gbafuo

Jun 22, 2022 - 19:36
 0
Ènwè Anarala Nwaanyị Nwa Ya Ebe Ọ Na-Enye Ya Ara, Gbafuo


Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu enwe achako a maghị ebe o si, nọrọ na nsonso a wee tụọ ka egbe ma nachara otu nwaanyị nwa ya ebe ọ na-enye ya ara, gbafuo.

Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ ihe bụ nke mere na mpaghara Kigoma dị na mba Tanzania, bụ ebe ènwè ahụ nọkwara wee jiri mbọ merụsịa nwata ahụ ahụ, bụ nwa ọhụrụ dị naanị otu ọnwa.

Na nkọwa ya banyere etu ya bụ ihe siri mee, nwaanyị ahụ nwe nwa ahụ, bụ Shayima Said kwuru na ya nọ n'ihu be ya na-enye nwa ya nwoke (bụ Luhaiba Said) ara n'ụlọ be ha dị na Mwamgongo, Kigoma, tupu ọtụtụ enwe si elu na ala wụchie be ya. Ọ sị na ka nke ahụ na-eme, ihe ọzọ ọ hụzịkwara bụ ka otu n'ime enwe ahụ bịara ozigbo, nachara ya nwa ọhụrụ ya ebe ọ na-enye ya ara wee ripu ọsọ, enwe ndị ọzọ wee gbara so ya.

Nke ahụ, dịka o siri kwuo, mezịrị ka o tibe mkpu maka enyemaka, nke mere ka ụfọdụ ndị mmadụ gbata n'ebe ahụ ozigbo, wee chụgide enwe ahụ, jide ya, ha na ya wee malite ịzọ nwa ahụ azọ, maka na o jidesiri ya ike, ma kwechiri na ọ gaghị ahapụ ya. Enwe ndị ọzọ nọkwa n'ebe ahụ na-aba mba ka ya bụ ihe na-eme.

Ka nke ahụ na-eme, ndị ahụ jizịrị ike wee dọpụta nwata ahụ n'aka enwe ahụ, bụkwazị nke mere ka o nwete mmerụahụ n'akụkụ ahụ ya dị icheiche, ma n'olu ma n'isi ya, n'ihi mbọ enwe ahụ gara ya na etu o siri jidesi ya ike mgbe ha na-azọ ya.

Kaosiladị, nwata ahụ mechaziere nwụọ n'ụlọọgwụ ebe a na-enye ya ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na mpaghara Kigoma, bụ Maazị James Manyama gbara akaebe na ihe ahụ mere n'ezie, ma dụọ ndị bi na mpaghara ebe ahụ ọdụ ka ha kpachapụ anya ma na-eke nkwụcha oge niile, n'ihi na e nwere ọhịa dị nso n'obodo ahụ, bụ ebe ụmụanụmanụ dị icheiche bi, bụkwa ebe ha na-esi abata n'ụlọ mmadụ maọbụ pụta n'okporoụzọ oge ụfọdụ, ịbịa nyara anwụ maọbụ ịbịa legharị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484