Onye Ogbuo Ọwara Ọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Ọnịcha

Nov 25, 2020 - 16:00
Jan 30, 2021 - 16:00
 0
Onye Ogbuo Ọwara Ọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Ọnịcha

Izunna Okafor

Oke ihe ịgba anyammiri dapụtara na nsonso a ọzọ, dịka otu onye ọkwọ ụgbọala ogbuo ọwara ọsọ jiri ụgbọala wee kọtuo ma kụgbuo otu nwaanyị na-agara onwe ya n'Ọnichị.

Dịka ozi e wepụtara site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps, FRSC' (ngalaba steeti Anambra) bụ Maazị Kamal Musa siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporo ụzọ bụ nke mere na ncherịta ihu ụlọọgwụ Toronto dị n'Ọnịcha, na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha.

O mere ka a mara na akụkọ ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na ajọ ihe mberede ahụ dapụtara n'ihi ịgba oke ọsọ, ma bụrụkwa nke mere oge otu onye na-anya ụgbọala jiri oke ọsọ wee kụtuo otu nwaanyị ji ụkwụ agara onwe ya n'ụzọ, ma jirikwa oke ọsọ fee ka nnụnụ, larie, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ ya anya ọzọ ma ya fọdụzie ịma ihe ọbụla banyere ya maọbụ ụgbọala ya.

Akụkọ kọrọ na ndị nọ nso oge ya bụ ihe mere nàkwà ndị ọrụ FRSC nọ na mpaghra Upper Iweka gbagara ebe ahụ ya bụ ihe mere ozigbo ma buru nwaanyị ahụ buga ya ụlọọgwụ Toronto, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ya, wee kwuo na ya bụ nwaanyị anwụọla, nke bụ na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya.

Ka ọ dị ugbua, a dọnyezịrị ozu nwaanyị ahụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ.

N'okwu ya banyere ajọ ọdachi ahụ onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Andrew Kumapayi kasìri ezinụlọ onye nke ha nwụrụ obi ma kpee ka Chineke nabata mkpụrụobi nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ma mekwa ka o zuru ike na ndokwa.

Ọ kpọkuzịkwara ndị na-anyà ụgbọala ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, ma nyekwa ndị ji ụkwụ aga ndụmọdụ ka ha na-esi n'ebe ahụ a rụrụ maka ndị ji ụkwụ wee na-agafe oge ọbụla, karịa ịgbafe n'etiti okporo ụzọ, n'ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ na-ewetakarị ihe mberede okporo ụzọ na ụdị ọnwụ mberede ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.