Uche Nwosu na Uloma Okorocha gbara akwukwo
![Uche Nwosu na Uloma Okorocha gbara akwukwo](/uploads/joom-images/rochas2.jpg)
Abraham Madu, USA
Otu a kwa ka o kwesịrị ịdị n’ala Igbo. Ka nwatakịrị toruru ịlụ nwanyị, ma ọ bụ ịlụ di, ka ọ hụ akụ na ụba ọ ga-eji gboo ya bụ mkpa dịrị nwoke ọbụla na nwanyị ọbụla toruru ogo ya.
Mana ọ bụrụ na ọlụ adịghị, ụkwa rue n’oge ya, ọ gaghị ada. Mana Igbo bụ Igbo na gbo gbo mara na ụkwa rue n’oge ya, ọ daa, ha jiri gbasie mbọ ike ịhụ na mbara egburu, egbue ọrịa ya.
Mazị Uche Nwosu na Lọlọ Ụlọma Nwosu, ka Chineke Ụmụ-Igbo were mkpụrụ afọ gọzie ọlụlụ dị na nwunye ụnụ!
Ka ndị ọzọ chọrọ ịlụ nwanyị na dị ka ụnụ hụkwa ego, ọlụ ha ga-eji gboo ya bụ mkpa dịka ụnụ! Igbo tụrụ ilu sị na e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma, kpọm kwem!
Mụọ nụ! Zụọ nụ!
What's Your Reaction?
![like](https://igboradio.com/assets/img/reactions/like.png)
![dislike](https://igboradio.com/assets/img/reactions/dislike.png)
![love](https://igboradio.com/assets/img/reactions/love.png)
![funny](https://igboradio.com/assets/img/reactions/funny.png)
![angry](https://igboradio.com/assets/img/reactions/angry.png)
![sad](https://igboradio.com/assets/img/reactions/sad.png)
![wow](https://igboradio.com/assets/img/reactions/wow.png)