Sinetọ Umeh Ekesàála Ndị Ọ Na-Azụ n'Akwụkwọ Nde Naịra Iri

Apr 5, 2022 - 22:58
 0
Sinetọ Umeh Ekesàála Ndị Ọ Na-Azụ n'Akwụkwọ Nde Naịra Iri


Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala nkwàdó agụmakwụkwọ dịka otu n'ime nkwàdo kachasị nkwàdó mmadụ pụrụ inye mmadụ ibe ya, ọkachasị onye ntorobịa maọbụ nwatakịrị, n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche dị na nke ahụ.

Onye bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance (APGA)’ n'ala Nigeria n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye nọchitere anya ọgbọ nta nkwado Anambra Etiti n'ụlọ ọgbakọ sineeti n'oge mbụ, bụ Sinetọ Victor Umeh bụ ya kwupụtara nke a na mmemme ọ chịkọbara iji kesàára ndị ọ na-azụ n'agụmakwụkwọ ha n'efu ego nkwàdo.

Mmemme nkesà ego nkwàdó agụmakwụkwọ n'efu ahụ a maara dịka 'Victor Umeh Education Foundation (VUMEF) bụ nke weere ọnọdụ na be nwa amadi ahụ, bụ Aguluzigbo dị n'okpuruọchịchị ime bobodo Anaocha na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kesàára ha ego ruru nde naịra iri (N10m).

Ya bụ mmemme bụ nke ọ na-eme kwà ahọ ọbụla kemgbe ahọ iri na ise gara aga, ma bụrụkwa nke o sitere na ya wee nye ụmụakwụkwọ mahadum karịrị otu narị n'ọnụọgụgụ ego ruru otu narị puku naịra n'otu n'otu maka ịkwàdò agụmakwụkwọ nke ahọ 2021/2020.

N'okwu ya oge ọ na-enye ndị ahụ ego nkwàdo ahụ, Sinetọ Umeh kwupụtara obi ụtọ ya banyere mkpụrụ dị icheiche atụmatụ nkwàdo agụmakwụkwọ ahụ mịpụtagoro nà ndị dị icheiche e sigoro na ya zụpụta kemgbe e jiri malite ya, ma kelee Chineke maka ịkwàdò ya bụ atụmatụ.

Ọ gbara akaebe na ohere agụmakwụkwọ ahụ azụpụtala ọtụtụ ndị na-eme nke ọma na ngalaba dị icheiche ugbua, ma kwe nkwa ịga n'ihi na-akwàdo ya bụ atụmatụ; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụakwụkwọ ahụ na-erite uru na ya bụ atụmatụ ka ha dị uchu n'agụmakụkwọ ha ma na-emewanye nke ọma, n'ihi na ọ na-abụrụ ha ihe agbamume oge ọbụla ọ hụrụ ha ka ha na-eme nke ọma n'agụmakwụkwọ ha maọbụ n'ihe ha na-eme oge ha gụchara akwụkwọ.

Na mbụ n'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisioche òtù nlekọta ‘Victor Umeh Education Foundation’, bụ Rev. Fr. Peter Uzoezie kọwara na ya bụ atụmatụ nkwàdo agụmakwụkwọ bụkarị maka ihe na-esiri ike, ma kọwakwa na ọ mịtala ọtụtụ ezi mkpụrụ dị icheiche ma bakwa ọtụtụ uru n'obodo kemgbe e jiri malite ya.

Ọ kọwara Sinetọ Umeh dịka nwoke obiọma Chineke ji akwara ngwaọrụ n'ụzọ dị icheiche n'ịgbanwe ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ akụnụba ụmụ mmadụ ụwa na-atụ n'ọnụ.

Ọ kpọkuzịrị ndị dị icheiche ọnọdụ dịịrị mma ka ha ñomie Sinetọ Umeh site n'icheta na ịkwàdò ndị ụwa na-atụ n'ọnụ bigasị na gburugburu ha; ọbụladị dịka o kpekwazịrị ekpere ka Chineke gọzie Sinetọ Umeh ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji maka ezi ọrụ dị icheiche ọ rụgoro na ndụ ụmụ mmadụ.

O nyekwàzịrị ndị ahụ na-agụ akwụkwọ e kesààrà ego nkwàdo ahụ ụbọchị ahụ ndọmọdụ ka ha gbado anya nke ọma n'agụmakwụkwọ ha ma gbalịsikwa ike mee nke ọma, ka ha wee jiri nzere kacha mma wee pụta.

Cheta na n'ahọ gara aga, otu onye n'ime ọtụtụ ndị ritere uru n'atụmatụ agụmakwụkwọ ahụ, bụ Dọkịta Juliana Umeh nọkwara na mmemme ahụ wee kọọ akụkọ ọgbụgbaama ma kelee Chineke na Sinetọ Umeh maka nzèré 'Distinction' o nwetere n'ule 'Internal Medicine and Surgery' nke ngalaba agụmakwụkwọ ahụike na Mahadum Port Harcourt, bụkwa nke mere ya onye mbụ nwetagoro nzere ahụ na ya bụ mahadum.

Nwaada Juliana Umeh, bụ nwaafọ Etiti, Nanka, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Orumba North' nke steeti ahụ kọrọ akụkọ ụwa ya etu ọ kaara isi chịkọta ma kwụsị agụmakwụkwọ ya oge nna ya nwụrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017, tupu Sinetọ Umeh wee gbataziere ya ọsọ enyemaka wee zụgide ya n'agụmakwụkwọ wee ruo ugbua ọ gụchara akwụkwọ ma nwetekwa nzere dịka onye kachara mee nke ọma na ngalaba ọmụmụihe ahụike na mahadum ahụ.

N'ahọ a, onye ọzọ soro rite uru n'atụmatụ nkwàdo agụmakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Chukwuma Nwanazoba, onye jiri nzere ‘First Class’ wee pụta na ngalaba ihe ọmụmụ ‘Chemical Engineering’ nke Mahadum Nnamdi Azikiwe kọkwàrà akụkọ ọgbụgbaama ya.

Ọtụtụ ndị ọzọ ka na-eritekwa uru n'atụmatụ nkwado ahụ, nke gụnyere Maazị Chinonso Onyeanusi nke ụlọakwụkwọ ‘Federal Polytechnic, Oko’ kelekwazịrị Sinetọ Umeh, kwe nkwa ịdịwanye uchu n'agụmakwụkwọ ha, ma kpekwaziere Chineke ka ọ gaa n'ihu ịgọzi na ibuli Sinetọ Umeh elu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484