NDLEA Ebibiela Ọgwụike Gburu Ego Ruru Ijeri Naịra Iri Ise n'Abuja

Dec 1, 2021 - 22:40
 0
NDLEA Ebibiela Ọgwụike Gburu Ego Ruru Ijeri Naịra Iri Ise n'Abuja

 
Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma e gbuo ìrùrò e suo ya ọkụ, maka ndụgha.

N'ịgbasò nke a, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ, ịñụ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) nọrọ ụbọchị Tuzdee wee bibie ọtụtụ ọgwụike gburu ego ruru ijeri kwuru ijeri naịra n'Abụja bụ isi obodo ala Nigeria.

N'okwu ya oge a na-ebibì ọgwụike ahụ na mpaghara FCT, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa kọwara mbibi ahụ e bibiri ọgwụike ahụ n'ihu ọhaneze dịka nke magburu onwe ya nà ngosipụta ezi nkwụdosiike ụlọọrụ ahụ dị n'ibu agha megide ọgwụike.

Marwa, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ odeakwụkwọ nke ụlọọrụ ahụ, Ọkaiwu Shadrach Haruna, kwuru na ọnụọgụ ọgwụ ndị ahụ a na-ebibi bụ ihe ncheta maka oke nsogbu ọgwụike n'ala Nigeria.

Ọ sị "Anyị nwere ike icheta na mgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari malitere mgbasaozi na ibu agha megide ọgwụike, nke a kpọrọ 'War Against Drug Abuse (WADA) n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa nke e mere n'okpuru nhazi ụlọọrụ NDLEA na June 26, 2021, o kwupụtara na WADA agaghị abụ naanị aha, kama na ọ bụ ọkpụkpọòkù ọrụ nyegara ụmụafọ Nigeria niile. Taa mbibi ọgwụike a ruru tọn iri abụọ 20, agaal n'ihu ịgba ezi ama maka nke ahụ.”

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọgwụike ahụ e bibiri ebe ahụ ụbọchị ahụ ruru kilogram 20,000 ma bụrụkwa nke gburu ijeri kwueu ijeri naira. O kwukwara na ihe ruru kilogram 19,598 n'ime ọgwụike ndị ahụ bụ nke e jidere site n'aka ndị ọrụ NDLEA na ngalaba FCT, nke gụnyere 19,178 kilos nke ọgwụike cannabis, 0.1 kilogram nke ọgwụike cocaine, 0.009  kilogram nke ọgwụike heroin, na 420 kilogram nke ụdị ọgwụike ndị ọzọ a kpọrọ psychotropic n'aha nchịkọta bekee.

Ọ kọwara na ọ bụ n'ọdụ ụgbọelu 'Nnamdi Azikiwe International Airport, Abuja' ka e jidere ọgwụike ndị ọzọ e sokwa wee bibie ụbọchị ahụ, nke gụnyere cocaine ruru kilogram 173, kilogram heroin ruru 36, kilo ephedrine ruru 93, kilogram methamphetamine ruru 60, gram 58 nke ọgwụike cannabis, gram 219 nke ọgwụike Rohypnol na gram 150 nke ọgwụike Tramadol.

Ọ sị "Dịka anyị na-ahụ ka a na-ebibi ọgwụike a ruru kilogram 20,000 n'ihu ọhaneze taa, ọ dị mma ka m mee ka ị mara na e nweela ụdị mbibi dị etu ahụ n'ọtụtụ steeti na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria n'ahọ a. Tụlegodinụ ụdị ọnọdụ izendụ na ihe égwù kaara ịdapụta ma ọ bụrụ na ọgwụike niile a bàrà n'obodo."

Marwa kwuru na ọ bụ ndị ọrụ ha nọ na FCT na ọdụ ụgbọelu mba ụwa 'Nnamdi Azikiwe International' nwụchiri ọgwụike niile ahụ, ma kọwaa na nke ahụ na-egosi na NDLEA adịghị akwụsị akwụsị na mbọ ọ na-agba iji kwalite nchekwa na ọdịmma nke ụmụafọ Naijiria pụọ n'ọgwụike. 

Ọ gara n'ihu kọwaa na mbibi ahụ ha bibiri ọgwụike ahụ dabàrà adabà n'ịgbaso iwu nke 'National Environmental Standards and Regulations Enforcement Agency (NESREA)' dịka ụzọ kacha mma isi kpochapụ ọgwụike.

Ka ọ na-ekwu na ọnụọgụ ọgwụike ndị a na-ebibi bụ ihe ncheta maka oke nsogbu ọgwụ na mba ahụ, Marwa kwuru na mmetụta dị egwu nke ọnụọgụgụ ọgwụike na-enwe n'obodo na na ndụ ụmụafọ Nigeria bụ ihe mere ụlọọrụ NDLEA n'okpuru ndu ya ji kwlitekwuo mbọ ọ na-agba ugbua n'ibu agha megide ọgwụike n'ala Nigeria.

Ọ sị na n'ihi nke ahụ, NDLEA emezigharịla nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ, usooro iji kwụsị mmepụta, ịkụ, nhazi, mbubata, mbupụ, ire, ịzụ ahịa na iji ọgwụike eme ihe na ihe ndị ọzọ iwu akwadoghị.

Dịka ọ na-ekele ndị ọrụ ya maka ezi agbambọ ha, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụ ike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.

Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche sonyekwara na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484