Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ọnaụtụ Atọ Iwu Akwadòghị̀ n'Anambra

Apr 5, 2022 - 22:39
 0
Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ọnaụtụ Atọ Iwu Akwadòghị̀ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ

Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ndị uweojii na steeti Anambra anwụchiela mmadụ isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ọnaụtụ iwu akwadòghị na steeti ahụ, n'agbànyèghị ntụziaka gọọmenti steeti ahụ nyere ka a kwụsịgodi ihe ọbụla bụ ịna ụtụ n'ime steeti ahụ.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Tochukwu Ikenga mere ka a mara maka nnwụchi ahụ a nwụchiri ndị a, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a.

O nyere aha ndị ahụ dịka Andrew Chukwueze (gbara ahọ iri na iteghete ma bmrụkwa onye sitere ‘Nkanu East’ nke steeti Enugu), Emmanuel Charles (gbara ahọ iri na asatọ, ma bụrụkwa onye sitere Umualoma nke Orlu dị na steeti Imo), Chigozie Bernard (gbara ahọ iri abụọ, ma bụrụkwa onye sitere ‘Izza West’ nke steeti Ebonyi), Chibueze Nduife (gbara ahọ iri atọ, ma bụrụkwa onye sitere steeti Ebonyi), Nnamdi Anyigba (gbara ahọ iri abụọ na asatọ, ma bụrụkwa onye steeti Enugu), na Ebuka Ogidi (gbara ahọ iri abụọ na ise, ma bụrụkwa onye steeti Ebonyi).

Ọ kọwara na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na mpaghara njikọ ụzọ ‘Kara Junction’ dị n'Atanị, nà ná mpaghara ụzọ Obodoukwu, ebe ha ha na-anakọsị ndị na-anya ụgbọala na mmadụ ndị ọzọ ego n'ụdị na hq bụ ndị ọnaụtụ gọọmenti.

DSP Tochukwu kọwara njide ahụ e jidere ndị ahụ dịka nke dabara adaba na ntụziaka ahụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Echeng Echeng nyere ndị ọrụ ya ịhụ na o nweghịzị onye ọbụla nara ụtụ ọbụla na steeti ahụ, dịka gọọmenti siri kwuo, ya na mkpebi ya ịhụ na ha chụrụ ndị ọnaụtụ iwu akwadoghị na ndị omekoome ndị ọzọ na-etinye aka n'ihe iwu akwadoghị ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

O mekwara ka a mara na ndị uweojii ahụ na ndị ọrụ nchekwa wakpokwara ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi na mpaghara ụzọ ‘Ring Road’ dị n'Isiagụ, Awka; ha (ndị ohi ahụ) wee bihapụ akpa egbe ha ji arụ ọrụ, ma rie mbọmbọ ọsọ. Akpa ahụ, dịka o siri kọwaa, bụ nke ha nwetara ụdị egbe na mgbọ egbe dị icheiche n'ime ya. O kwukwara na a ka na-agbasi mbọ ike ịnwụchi ndị ohi ahụ.

Dịka ọ na-ekele ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ maka ezi ọrụ ahụ, o kelekwara Ndị Anambra maka inye ndị uweojii ozi dị mkpa na-enyere ha aka n'ọrụ ha, ọ rịọkwazịrị ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ. 

CP Echeng kwèzịrị nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ e jidere ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyòcha banyere okwu ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484