NDLEA Anwụchiela Onye Na-atụ Mgbere Ọgwụike Na-ewu Èwù

May 23, 2022 - 00:14
 0
NDLEA Anwụchiela Onye Na-atụ Mgbere Ọgwụike Na-ewu Èwù

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị ụlọọrụ ahụ na-ebu agha megide ịñụ, ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) akparala otu nwaanyị na-ewu n'ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ Oriakụ Bridget Oghenekevwe Emeka, onye a maara dịka ‘Mama’

Akụkọ kọrọ na-akọ na e jidere 'Mama' (gbara ahọ iri ise na iteghete) n'ụlọ ezumike ya bụ ebe ọ na-esi nri ma na-ekesakwa ụdị ọgwụike dị icheiche, nke gụnyere Cocaine, Methamphetamine na ụdị ọgwụike ndị ọzọ iwu akawdòghị.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Femi Babafemi bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ.

Ọ mere ka a mara na e jidekwara mmadụ karịrị itoolu n'ime ndị ọrụ nwaanyị ahụ n'ime nnukwu ụlọ ya ahụ dị na Warri nke steeti Delta, ebe ọ na-ahazi ma na-eresi ndị mmadụ ọgwụike.

Dịka Babafemi siri kọwaa, e wezuga ọnụọgụ ụdị ọgwụike dị icheiche e nwetere n'ebe ahụ, nke gụnyere Crack Cocaine, Methamphetamine, Molly, na Loud; e nwetakwara égbè, ọtụtụ mgbọ egbe na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, nke gụnyere ụgbọala, ekwentị, akwụkwọ e ji ekechi ọgwụike ike na ngwa ọgwụike dịka sodium bicarbonate na ihe ndị ọzọ.

O kwuru na ka e jidechara mmadụ ise n'ime ụmụ ọrụ ya, bụ ndị na-esi nri, na-ekechi, ma na-ekesa ọgwụike ndị ahụ n’ụlọ ya dị na mpaghara Favor Street, Otukutu, Effurun Warri; e jidekwara mmadụ anọ n’ime ndị òtù ya n’ebe ha na-atụ mgbere ọgwụike na mpaghara ebe ndị ọzọ dị icheiche n’obodo ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484