Na Kano, Ndị Uweojii Ejidela Nwoke Na-Ere Ọgwụ Adịgboroja

Apr 22, 2022 - 19:08
Apr 24, 2022 - 19:09
 0
Na Kano, Ndị Uweojii Ejidela Nwoke Na-Ere Ọgwụ Adịgboroja


Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Kano akpàrála otu nwoke a na-enyo ènyò na ọ bụ onye na-atụ mgbere ọgwụ adịgboroja na steeti ahụ.

Ya bụ nwoke, bụ Maazị Chibezie Onocha, bụ onye e kwuru na ọ gbara ahọ iri abụọ na asaa, ma bụrụkwa onye a nwụchikọrọ na mpaghara ‘Sabon Gari Quarters’ dị na steeti ahụ

Dịka ozi a kụpụụrụ ndị ntaakụkọ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Kano, bụ SP Abdullahi Haruna Kiyawa siri kọwaa, ọ bụ ndị ọrụ uweojii pụrụ iche a maara dịka ‘Operation Puff Adder’ jidere nwoke ahụ oge ha bangidere na mkpagharị nnyocha na mpaghara okporoụzọ IBB.

O mere ka a mara na ihe dị icheiche e nwetere n'aka nwoke ahụ gụnyèrè àkpà ọgwụ ‘Rubber Solution’ ruru otu narị n'ọnụọgụgụ, igbe mkpụrụọgwụ ‘Buscomac Tablets’ ruru ise n'ọnụọgụgụ, igbe mkpụrụọgwụ ‘GVN Griseofulvin Tablets’ ruru atọ n'ọnụọgụgụ, na igbe ọgwụ ‘Healmoxy Capsules’ ruru abụọ n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke mkpokọta ọnụego ha niile ruru nde naịra abụọ na ụma narị puku naịra ise na iri isii (N2,560,000).

SP Kiyawa kwuru na site na nnyocha e megoro nà ajụjụọnụ a gbagoro ya bụ nwoke, a chọpụtara na ọgwụ niile ahụ bụ adịgboroja, ma bụrụkwa nke o siri steeti Lagos bubàta na Kano, ma na-achọkwazị isi na Kano buru ha gaa mba ‘Niger Republic’.

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gàkwàzịrị n'ihu kọwaa na onyeisi ndị uweojii na steeti Kano, bụ CP Samaila Shuaibu-Dikko enyela ntụziaka ka e mee nnyocha miri èmì banyere nwoke ahụ na ọgwụ ọdịgboroja ahụ; nke, mgbe e mechara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu mee tie ya mmọnwụ, dịka ihe o mere siri dị.

Ọ dị ncheta na ndị uweojii steeti Kano nọkwara na nsonso a wee nwụchie otu nwoke ọzọ gbara ahọ iri atọ na atọ, bụ Maazị Agbo Victor, onye na-ewu èwù n'ịtụ mgbere ọgwụike, ma bụrụkwa onye e nwetere àkpà ọgwụike ‘Indian hemp’ ruru narị abụọ na iri ise n'aka ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484