Ọgwụ Ike: NDLEA Anwụchiela Mmadụ Ise n'Abuja

May 9, 2021 - 22:50
May 30, 2021 - 19:18
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a


N'ịga n'ihu n'ịchụ ọgwụ ike ọsọ ụkwụ erughịa ala, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ maọbụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala Nigeria a mara dịka 'National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA' (ngalaba nke Abuja) anwụchiela mmadụ ise maka itinye aka n'ihe metụtara ọgwụ ike.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ngalaba ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n'Abuja, bụ isi ala Nigeria, bụ nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ndị ahụ gụnyèrè ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị.

O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị ọrụ NDLEA ahụ wakpòrò ebe ndị ahụ na-ezo na ebe ha nọ were akụ ajọ akụmakụ ha ka e jiri wee nwụchie ha.

Dịka o siri kọwaa, ndị ahụ a nwụchikọrọ na nsonso a na-esi n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ dị iche iche wee na-eresi ndị mmadụ ihe oriri dị iche iche e jiri ọgwụ ike wee mee.

Ọ gara n'ihu nye aha ndị ahụ a nwụchikọrọ dịka Queen Nvene, Collins Ozoemena, Samson Peter, Chika Nvene, na Habila Musa; ma kwuo na ha na-ere ihe ahụ na mpaghara ebe dị iche iche n'Abuja ahụ bụ isi obodo, site n'iji ọgbaatumtum na-eje ozi wee na-ekesa ma na-ebusa ya n'ebe dị iche iche.

Ka o sila dị, ndị ọrụ ahụ mezịrị nnyocha na mpaghara Gudu, Kubwa, Lokogoma, Apo na Damangazo, nke onyeisi ha n'ebe ahụ bụ Maazị Mohammed Malami Sokoto duru ha wee mee; ha hụtasịrị ụfọdụ ọgwụ ike dị iche iche n'ebe ndị ahụ, bụkwazị nke ha bukọọrọ ma kpọchie.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị ọrụ NDLEA, ngalaba nke steeti Ondo, nọkwàrà na nsonso a wee nwụchikọọ otu nwoke, bụ Maazị Emmanuel Utaji (gbara ahọ iri abụọ na iteghete) na mpaghara Akure, maka ọgwụ ike. Nke a bụ nke ndị ọrụ ahụ mere oge ha nwụchikọchara ọgwụ ike 'cannabis' kilogram ya ruru iri isii n'okporoụzọ, bụkwazị nke ha sitere na ya wee chọpụta na aka nwoke ahụ dị na ya.

N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ NDLEA, ngalaba nke steeti Rivers nwụchìkọkwàrà onye ọzọ na-atụ mgbere ọgwụ ike ma na-ezukwa ohi, bụ Maazị Sanusi Abdullahi, onye ha nwètàkwàrà ọgwụ ike 'skunk' arọ ya ruru kilogram 15.8, nà 'sim card' ruru iri na isii n'aka ya.

N'okwu ya banyere nke a, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohamed Buba Marwa kwupụtara obi ụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụ ike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484