Soludo Akpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Na-Esonyesi Ike Na Ndọrọndọrọ Ọchịchị

May 17, 2021 - 20:43
May 17, 2021 - 20:48
 0
Soludo Akpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Na-Esonyesi Ike Na Ndọrọndọrọ Ọchịchị

Dịka Ndị Òtù YESS Jiri N2,000,000 Kwàdo Ya Ịzọ Ọkwa Gọvanọ Anambra

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ndị ntorobịa ọdụ ka ha na-esonyesi ike n'ihe gbasaara ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti ha dị iche iche na n'ala Nigeria n'izugbe, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewèta, ọkachasị site n'ime ka ha sonye n'ihe a na-eme n'ọchịchị obodo, na n'ịhọpụta ezi onye ndu.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onye ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ọba ego ala Nigeria (Central Bank of Nigeria, CBN), bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, n'okwu ya oge ọ na-anabàta ma na-ekèle ndị òtù nkwàdo a maara dịka 'Youths Earnestly Seek Soludo' (YESS), bụ ndị jiri nnukwu ọkpụrụkpụ ego wee kwàdo ya n'achụmta ịzọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra.

N'okwu ọ gwara ndị òtù ahụ (bụ ndị ntorobịa) n'obodo ya dị n'Isuọfịa, n'okpuru ọchịchị Agụata, nke steeti Anambra, Ọkammụta Soludo, onye ji aha òtù ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance' (APGA) were apụta maka ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, kọwàrà ndị ntorobịa dịka ndị dị óké mkpà n'obodo ọbụla, ma kpọkuo ha ka ha jiri ọchịchọ obi nà akọnuche dị mma wee na-esonye na ndọrọndọrọ ọchịchị, iji weta mgbanwe ziri ezi, wèta ọganihu nakwà ezi ọnọdụ mmepe bụ ịgbà.

Dịka ọ na-ekwe ndị Anambra nkwà na ọ ga-ebulitekwu ọnọdụ mmepe na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ n'ogoogo dị elu, malite n'ebe aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Gọvanọ Willie Obianọ rụdobere; Ọkammụta Soludo mékwàzịrị ka a mara na ọchịchị ya ga-agbasi mbọ ike ịkwalite ọdịmma ndị ntorobịa steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkùzịrị Ndị Anambra ka ha nye ya nkwàdo ha iji nweta mmeri na nhọpụta ọchịchị ahụ, ka o wee mezùpụtachaa ezi ebumnobi o ji were apụta ịzọ ọkwa ahụ.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-enyefe ya akwụkwọ ndọrọ ego nde naịra abụọ (2 000,000) ahụ, onyeisi òtù YESS, bụ Dọkịta Nelson Omenugha kọwàra ego ahụ dịka ihe ha bụ ndị ntorobịa jì akwàdo ya ịzọ ọkwa Gọvanọ ahụ, n'ihi na ha hụtara ya dịka onye tozùrù òkè, onye nwere ezi ọgụgụisi, ahụmahụ, na ihe ndị ọzọ a chọrọ n'aka onye ọbụla ga-ewèghara ọkwa ọchịchị steeti ahụ.

Ọ kọwàkwàrà na ebumnobi ha bụ ndị ntorobịa jiri wee nye ya ego nkwàdo ahụ, bụ ka ha were ya wee jidere ya ọfọ n'ihe gbasaara imezupụta nkwa dị iche iche o kwere ugbua ọ na-azọ ọkwa gọvanọ ahụ, maka mgbe ọ ga-enwetachaa nturuugo, ka o wee ghara ịgharịpụ ndị ntorobịa, ka o wee chịa steeti ahụ nke ọma, ma mezupụtachaa ihe bụ ọchịchọ obi ndị ntorobịa nà ihe ndị ọzọ o kwere na nkwà.

Dọkịta Omenụgha mèrè ka a mara na égwú adagharịala ugbua n'ihe gbasaara igwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, ọkachasị na steeti Anambra, n'ihi na ndị ntorobịa na-esonyesizị ike n'ịhọpụta onye ndu steeti ahụ, iji hụ na e nwere ezi ọdịnihu maka ndị ntorobịa steeti ahụ nà ọdịmma ha.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, Kọmishọna steeti Anambra na-ahụ maka ihe ndị e ji enyere ndụ aka, bụ Maazị Emeka Ezenwanne kpọpụtasịrị ụfọdụ ezi ihe dị iche iche e kwesiri ilekwàsị anya wee na-ahọrọ onye ndu, bụ nke ọ kọwara na Ọkammụta Soludo nwèrè, dịka o siri metụta ọkwa Gọvanọ ahụ ọ na-azọ, ọbụladị dịka o tòrò ndị ntorobịa ahụ maka ịhụta ezi olileanya na ezi ọdịnihu steeti Anambra n'ebe Ọkammụta Soludo nọ, bụzị nke mere ha jiri tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàdò ya n'ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè odeakwụkwọ ndị òtù YESS, bụ Maazị Emmanuel Nwankwo; ótù nnukwu onye ọrụ ahụike bi na mba UK, bụ Dọkịta Charles Ojukwu, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484