Soludo ekeleela Bishọp Okpaleke ka Poopu Francis họpụtara ya ịbụ Kadịnal

Jun 7, 2022 - 21:28
 0
Soludo ekeleela Bishọp Okpaleke ka Poopu Francis họpụtara ya ịbụ Kadịnal

 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 Aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Chukwuma Soludo ekeleela Bishọp dayọsis Ekwulobia, bụ Most Rev. Peter Eberechukwu Okpaleke, maka nhọpụta His Holiness Pope Francis họpụtara ya ịbụ Kadịnal.
N'etiti ehihieụbọchị ụka gara aga ka e kpechara 'Ǹụlịba Ezenwaanyị nke Eluigwe', ka Pope kwuputara na ọ ga-akwụba ndị Kadinal iri abụọ na otu n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a, bụ́ ndị erubeghị afọ iri asatọ mà bụrụkwa ndị ga-eme nhọpụta onye ga-anọchi anya ya.
 O kwupụtàrà nke a n'obi Chukwu, St Peter's Square, Vatican City, ma kọwaa na nke ahụ ga-amàlite dịba ìrè n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a.
  Ọ dị ncheta na Poopu Benedict XVI họpụtàra Okpaleke dịka Bishọp dayọsis Ahiara nke dị na steeti lmo, n'afọ 2012; mana ha jụrụ ịnabata ya n'ihi na ọ bụghị onye be ha.
 Ka ọ gachara afọ asaa, a kwụbara Okpaleke dịka Bishọp izizi nke dayọsis Ekwulobia, steeti Anambra, n'ihi na ọ dịla na mbụ n'afọ 2018,  rịọ ma hapụzie ọkwa ahụ e nyere ya n'Ahiara, ka udo were chịa. 
  A ga-anọ n'emume pụrụ iche a maara dịka 'consistory' wee bulie ya na mmadụ iri abụọ ndị ọzọ n'ọkwa Kadinal.
 Naanị Bishọp Okpaleke bụ onye Nigeria so na ndị niile ahụ a họpụtara. Ndị ọzọ si na mba ndị ọzọ gụnyere France, Brazil, lndia, Philippines, Mongolia, Paraguay, Timor Oriental na ltaly.
   Ndị Kadịnal erubeghị afọ iri asatọ ga-enwe ikike isonye na nhọpụta onyeisi ụka Katọlik n'ụwa gbaa gburugburu, bụ́kwá nke a na-esi na ndị Kadinal ahọpụta.
   N'ihi nhọpụta a, Gọvanọ Soludo sị na ọṅụ ya pụwagara íchè n'ihi na ya bụ ngọzị bàtàrà nà dayọsis ya na steeti Anambra n'ọyọ, ma kọwakwaa ya dịka ihe ọgbụgbaama na steeti Anambra bụ 'Ìhè Ala Anyị'. 
 N'ozi ekele ahụ nke Odeakwụkwọ Mgbasaozi ya, Christian Aburime tinyere aka na ya, Gọvanọ ahụ kọwara mbulielu ahụ dịka ụgwọ ọrụ ọma ruuru Bishọp Okpaleke, onye nke o kwuru na ọ tụnyele ezigbo ụtụ n'ọrụ Chineke.
 Gọvanọ Soludo rụtụrụ aka na ọ bụ naanị ndị Africa abụọ, tinyere Bishọp Okpaleke bụ ndị so na Bishọp iri abụọ na otu ahụ e buliri n'ọkwa Kadịnal, ma kwuo na Bishọp Okpaleke bụ Kadinal nke abụọ e nwere na steeti Anambra, ma Cardinal Francis Arinze werechaa.
 A mụrụ Bishọp Okpaleke n'abalị mbụ nke ọnwa Maachị n'ahọ 1963 n'Amesi nke dị n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata na steeti Anambra. E chiri ya Bishọp n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee ahọ 2013, ma họpụta ya ịbụ Kadinal n'abalị iri abụọ na iteghete nkè ọnwa Mee ahọ 2022. 
 Gọvanọ Soludo, n'aha gọọmenti na ndị ọma steeti Anambra, kpọkuru Chineke ka o nyewanye Bishọp Okpaleke ike, ezi ahụike na amamihe, iji chawapụ n'ọrụ ọhụrụ ya n'ugbo (vineyard) Chineke.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484