Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ụmụnwaanyị Anaghị Agba Afụọnụ

Nov 23, 2021 - 22:53
Nov 23, 2021 - 23:08
 0
Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ụmụnwaanyị Anaghị Agba Afụọnụ
: :
playing

Izunna Okafor dere akụkọ a

N’oge gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, ma ụmụnwoke ma ụmụnwanyị na-agba afụọnụ.

N’oge ahụ, o nwere otu agadi nwanyị aha ya bụ Mmaakụ. Nwanyị a wara anya ma na-akpa agwa ka nwoke. Afụọnụ ya buru ibu ma tokwa ogologo. Ndị obodo ha nwere oke mmemme ha na-eme afọ ọbụla. 

Ka ha na-eme mmemme a n'otu ahọ, eze obodo ahụ pụtara gbaa egwu. Mgbe ọ gbachara egwu, o bidoro chọba ọlaedo ọ na-agba n’aka achọ.  Ọla aka ahụ e jiri ọlaedo wee rụọ bụ ebe amamihe eze dị. Nke a pụtara na eze agaghị achịnwu obodo ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọla aka ahụ.

Ka nke ahụ na-eme, onye ọbụla, ma ewu ma ọkụkọ malitere chọba ọla aka eze a n’ike n’ike, mana a hụghị ya, n'agbànyèghị ihe niile a chọrọ ya. Ma eze n'onwe ya sokwa were achọ ya bụ ọla aka.

Nke a mezịrị na e buru ikpe bịa n’obi eze, ọ gaghị amazị ihe ọ ga-ekpe. N’ihi nke a, eze kwezịrị onye ọbụla ga-achọta ọla ahụ nkwa ihe akụ akụ na ihe enwe enwe.

Otu ụbọchị, nwa odibo Mmaaku na-aga nkụ, wee tụụta ọla, ọ maghị ihe ọ bụ; o wee wegara ya nne ya ukwu. Nne ya ukwu matara na ọ bụ ọla eze ahụ a na-achọ achọ; o wee nara ya nwata ahụ, zoo ya. Ihe o bu n'uche wee mee nke ahụ bụ ka ọ ga-abụ nwa ya nwoke tolite ka o nye ya ọla ahụ ka o were bụrụ eze. N’ihi anya ukwu ya, o gosịghị dị ya ọla ahụ.

Mgbe a chọchààrà ọla ahụ, ma a hụghị ya, eze gara na nke dibịa afa, wee gbaa afa. Dibịa gwara ya na ọla ahụ dị n’obodo ya, na ọ bụ mmadu zoro ya.

N'ihi nke ahụ, eze nyere ndị agha ya iwu ka ha ga chọba ọla ahụ n’ụlọ n’ụlọ. Mgbe a chọchara ma a hụghị, eze gaghachiri azụ ga gbakwa afa ọzọ.

Mgbe ahụ, dibịa gwara ya ka o si n’ebe ụmụnwanyi nọ wee chọba ya. Ndị agha eze gara chọchaa, mana ha ahụghị ya. Eze gaghàchikwàrà azụ na nke dibịa, wee gbaa afa nke ugboro atọ, e wee gwa ya na o nwere nwanyi a chobeghi ya n’ụlọ ya.

Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị agha ya ma jụọ ma ha nà o nwere nwanyi ha achọghị ọla ahụ na be ya, ndị agha ya gwara ya na ha achọghị ya na be Mmaakụ n’ihi nsọpụrụ ha nwere ebe ọ nọ, tinyekwuoro na ọ bụ ezigbo okenye na ha eleghi anya na ọ ga-ezu ohi.

Eze nyere ha iwu ka ha gaa n’ụlọ ya ozigbo gaa chọọ ọla ahụ. Mgbe ha ruru n’ụlọ ya, ha kwaghachara ebe niile, ma ha ahụghị ọla ahụ. Ha chọrọ ọla ahụ abali atọ na be ya, mana ha ahụghị ya.

Mmaakụ bidoro mebe ọnụ. N’ihi nke a, ọ pụtara na mbara be ya na-agba egwu iji gosi na aka ya dị ọcha. Mgbe ọ na-agba egwu, ọla eze si na nnukwu afụọnụ ya dapụta bụ ebe o zoro ya. Nke a wee rie ndị mmadu ọnụ. Ike wee gwụ di ya.

Eze jiri iwe nye iwu ka Ezemmụọ obodo ahụ ka a kpụọ Mmaakụ afụọnụ ya ozigbo. Mgbe e mechara nke ahụ, o nyekwara iwu ka a kpụọ ụmụnwanyi niile afụọnụ.

Ezemmụọ were nsị mbe tee n’agba ụmụnwanyị niile ahụ ma kwubie okwu na ụmụnwanyi agaghị na-agbazị afụọnụ.

Bido ụbọchị ahụ wee ruo taa, ụmụnwanyị anaghị agbazị afụọnụ, sọọsọ ụmụnwoke na-agba afụọnụ.

Ọ bụ nke a mere na ụmụnwaanyị anaghị agba afụọnụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484