Ụwa nile amatago onye otu ISIS ahụ na-afọnye ndị mmadụ mma n’akpịrị

Ụwa nile amatago onye otu ISIS ahụ na-afọnye ndị mmadụ mma n’akpịrị

Feb 26, 2015 - 06:25
Jan 20, 2021 - 06:26
 0
Ụwa nile amatago onye otu ISIS ahụ na-afọnye ndị mmadụ mma n’akpịrị

Ndị ọrụ nchekwa ekwuola na ha achọpụtago onye bụ nwoke onye otu ISIS ahụ a na-ahụ n’ihe onyonyo ndị otu agha iyi egwu ebe ọ na-afọnye ndị mmadụ mma n’olu. Nwoke ahụ a ma ama dịka Jihadi John, onye na-afụ onwe ya mmanwụ mgbe ọ bụna ọ pụtara n’ihe onyonyo maka igbu mmadụ, egbuona mmadụ ole n’ole ndị nta akụkọ.

Ndị o gbugoro n’ehihie ọcha n’ihe onyonyo gụnyere James Foley, nwa afọ mba Amerịka.

A na-akọwa na a hụkwara ya n’ihe onyonyo ndị otu ISIS ahụ gosiri ogbugbu Steven Sotloff, onye nta akụkọ si mba Amerịka, David Haines, onye ọrụ enyem aka si mba Briten, Alan Henning, onye ọkwọ ụgbọala si mba Briten, na Abdul-Rahman Kassig, onye ọrụ enyem aka si mba Amerịka.

A chọpụtara n’ezigbo aha nwoke ahụ na-aza Jhadi John bụ Mohammed Emwazi. Mohammed Emwazi bụ onye mba Briten, mana a mụrụ ya na mba Kuweti. Tupu ọ banye n’otu ISIS, nwoke a na-erubeghị afọ iri atọ bibu na mpaghara ọdịda anyanwụ nke obodo London, na Briten.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.