Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Abụọ Bu Isi nà Aka Mmadụ n'Àkpà

May 6, 2022 - 11:47
May 6, 2022 - 12:28
 0
Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Abụọ Bu Isi nà Aka Mmadụ n'Àkpà

Izunna Okafor na Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a


Ndị uweojii steeti Kwara anwụchikọọla mmadụ abụọ bu isi na aka mmadụ a ka gburu ọhụrụ n'ime akpa. Ọ bụ n'ogologo ụzọ Oke-Oyi/Jebba ka ya bụ ihe mere.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Okasanmi Ajayi bụ ya mere ka ụwa mara nke a, ma kwuo na oge ndị uweojii na-agba ha ajụjụ, mmadụ abụọ ahụ kpara arụ, Wasiu Omonose  gbara afọ iri atọ na ise na Akibi Ibrahim gbara afọ iri atọ na abụọ kwuru na ha na-ebugara otu 'Alfa' nọ n'Ilorin akụkụ ahụ ndị ahụ maka iji ha gwọọ ọgwụ.

O kwuru sị na ọ bụ ka ndị uweojii kwara na-agba mbọ ikwochapụ arụrụala na steeti ahụ ka ndị uweojii nọ na ngalaba Operation Harmony jidere ha wee hụ ihe ndị ha bu n'akpa.

Dịka o siri kwuo, mmadụ abụọ ahụ bù ọgbatumtum gbara ọsọ ka ha gbanarị ndị uweojii, ma ha chụrụ ha ọsọ, wee jide ha.
 
N'okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Tuesday Assayomo, dọ̀rọ̀ ndị arụrụala niile aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe ma makwaa ọkwa na onye ọbụla e jidere ga-agba egwu a ga-akụrụ ya n'ihi na a ga-eme ya ihe iwu kwuru.

Kọmishọna ahụ gara n'ihu kwuo na a ga-akpụpụ mmadụ abụọ ahụ e nwetere akụkụ ahụ mmadụ n'aka ha ụlọikpe, ma e mechaa nnyocha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484