Gọọmentị Anambra Etoola Ụlọọrụ Rotech Maka Ịkwalite Ọrụ Mmepe

Jan 20, 2021 - 16:49
Jan 21, 2021 - 18:19
 0
Gọọmentị Anambra Etoola Ụlọọrụ Rotech Maka Ịkwalite Ọrụ Mmepe

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ e tòó nwaanyị gwọrọ akịdị mmamma, ọ gwọtakwuo ọzọ.

Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti Anambra etòóla ụlọọrụ 'Rotech Energy Services Limited' maka ọrụ mmepe dị iche iche ha na-arụ n'ime steeti ahụ, ọkachasị ogige ebe obibi ahụ a kpọrọ 'Anambra Luxury Place Estate, Nkwelle-Ezunaka', bụ nke nyegoro aka n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

Gọọmenti Anambra kwupụtara ma nye òtùtó a oge a gara ileta ka ọrụ si aga na mpaghara ebe ahụ a na-arụ ogige ebe obibi 'Anambra Luxury Place Estate' ahụ na Nkwelle- Ezunaka dị na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Oyi.

Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Michael Okonkwo, na onyeisioche ụlọọrụ 'Anambra State Investment, Promotion and Protection Agency, (ANSIPPA)', bụ Maazị Jide Ikeakor nọchitere anya gọọmentị steeti Anambra na njem nleta ọrụ ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-edugharị ndị ọrụ gọọmenti n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ ya bụ ogige, onyeisioche ụlọọrụ 'Rotech Energy Services Limited' bụ Maazị Augustine Oguejiofor nyere nkọwa banyere ogoogo ọrụ ahụ nọ na ya ugbua. O kwuru na ya bụ ògìgè enweelarị ndị bi na ya ugbua, nwee ndị ọrụ nchekwa, nwee ogige ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ, nwee ọkụ na-enwu anyụghị anyụ, ma nwekwa okporoụzọ a rụchagoro arụcha.

O kwupụtara ma kelee ọchịchị steeti Anambra, na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi nkwàdo pụrụ iche ha nyere, nke mere ka ya bụ ọrụ na-agawanye n'ihu ọsọọsọ n'enweghị ihe ndọghachi azụ ọbụla. Ọ gakwara n'ihu kwuo na a rụrụ ogige ebe obibi ahụ ka ma ọgaranya ma ogbenye ga-ebinwu na ya ma nwee ike ịkwụ ụgbọ ụlọ.

Ọ kpọpụtasịkwara uru dị iche iche ogige ebe obibi ahụ ga-ewèta, ọkachsị dịka o siri metụta ime ka ndị Anambra nwee ogige ebe obibi bụ ịgbà ma nwekwa ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka, ikewàpụta ohere ọrụ nye ndị ntorobịa, na ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti n'izube.

N'okwu nke ya oge ha letachara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSIPPA, bụ Maazị Jide Ikeakọr gosipụtara afọ ojuju ya na obi ụtọ ya banyere etu ya bụ ọrụ si aga, ma jirikwazie ohere ahụ kpọkuo Ndị Anambra ka ha ñaa ntị ma za òkù 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ ma welataruo akụnụba ha ụlọ site n'ịrụnye ihe ga-eweta mmepe maọbụ kwalite ọnọdụ akụnụba, maka na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kparaha ya. 

Ọ gara n'ihu kwuo na Anambra bụ steeti kachara nwee ezi ọnọdụ dị larịị ugbua maka iwunye akụnụba, ịzụ ahịa, ịrụ ọrụ, na iji ego achụ ego n'ụzọ dị iche iche iwu kwàdoro.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Michael Okonkwo kọwara ogige ụlọ ebe obibi ahụ dịka atụmatụ ọrụ magburu onwe ya, ma kọwakwa ya dịka nke kwesiri nñomi. 

O kwuru na ụlọ ahụ ga-enye aka ibèlàtà nsogbu enweghị ụlọ ebe obibi na steeti ahụ, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ dị iche iche ọ ga-ewèta. Ọ jakwazịrị ụlọọrụ ahụ ike ma gwa ha ka ha jisie ike n'ọrụ.

A rụchaa ya, ogige ebe obibi ahụ bụ nke ga-enwe ụlọ ebe obibi dị iche iche, akụrụngwa ọgbara ọhụrụ dị iche iche, CCTV, ogige ndị uweojii, ụlọ nkwariakụ, ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ, okporoụzọ dị ezi mma, ebe a na-ere ihe, tinyere ihe ndị ọzọ dị iche iche e ji enyere ndụ aka, nakwa ihe ndị ọzọ e ji akwàlite ọnọdụ obibi ndụ maka ndị ga-ebi ebe ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.