Na Kwara, A Nwụchiela Ndị Ji Mmadụ Agwọ Ọgwụ Ego

May 14, 2022 - 19:16
 0
Na Kwara, A Nwụchiela Ndị Ji Mmadụ Agwọ Ọgwụ Ego

 Chinwendu Uzoatu

Ndị uweojii na steeti Kwara anwụchikọọla mmadụ abụọ na-egbu mmadụ maka ịgwọ ọgwụ ego, ma bụrụkwa ndị ntọrị mmadụ na ndị ohi a ma ama, bụ ndị e kwuru na o teela aka ha jiri kpaba ike ọjọọ na mpaghara ahụ, site n'ịtọrọ ndị mmadụ maka iji ha gwọọ ọgwụ ego.

 Ndị uweojii ahụ kwuru na ndị omekome ahụ a nwuchikọrọ atọrọla ndị mmadụ ruru iri na ise n'ọnụọgụ maka ọgwụ ego, nke gụnyere ụmụejima nwaanyị abụọ, bụ́ ụmụ eze ọdịnala, Owalobo nke Obbo Ayegunle dị n'okpuru ọchịchị Ekiti na steeti Kwara.

 Ndị uweojii ahụ zọpụtara mmadụ iri n'ebe nzuzo ndị ntọrị ahụ dị n'ọhịa Ejiu, Obbo, Ile na Osi, Kwara South na steeti ahụ.
 
Ha kwùrù na e nwere otu nwoke gbara afọ iri atọ na asatọ aha ya bụ Alede James, onye ya na ndị òtù ya tọọrọ nwa afọ iteghete, Faith Samuel, ma gbuo ya maka ọgwụ ego, ma kwuo na ọ bụ ka ha gara ili ya na mpaghara Ikotun n'Offa ka ndị uweojii nwụchikọrọ ha.

 Kọmishọna uweojii steeti ahụ, bụ́ Maazị Emienbo Teusday Assayomo gwara ndị ntaakụkọ na ndị  omekome ahụ bụ ndị oji egbe ezu ohi na ndị ntọrị ma bụrụkwa ndị na-etinyekwa aka n'ịgwọ ọgwụ ego. O kwuru na ha na-atọrọ ndị mmadụ, gbuo ha, jiri ha gwọọ ọgwụ ego. 

Dịka o siri kwu, ndị uweojii site na njikọ aka ndị nche na ndị na-agba nta n'obodo; na ndị omekome ahụ gbara mgba dị egwu. O kwuru na ha kpochapụrụ ebe nzuzo niile nke ndị ntọrị ahụ ka ọnwa Epure dị n'abalị iri na asaa n'afọ a bụ 2022.

 Kọmishọna Assayomo gara n'ihu kwuo na otu ọjọọ ahụ, ka ọnwa Maachị dị n'abalị iri na iteghete n'afọ a, tọọrọ mmadụ atọ ma kpọrọ ha gaa n'ebe nzuzo ha dị n'ọhịa Osi, maka iji ha gwọọ ọgwụ ego.

Ọ kọwara na ka ha na ha kwachara mgbọ, na ha zọpụtara mmadụ atọ n'ebe ahụ, ma jide ndị ntọrị ahụ, ebe ụfọdụ bu mmerụ ahụ sitere na mgbọ egbe were gba ọsọ. Otu n'ime ha, onye a maara dịka Dogo bụ onye ndị uweojii na-achọ achọ maka igbu otu nwoke aha ya bụ Femi Afolayin na Febụwarị. 

 O kwuru na ndị ọrụ ya nwetagasịrị egbe na mma, mgbọ na ọgwụ a gwọrọ agwọ n'ebe nzizo ha ahụ.
 Ọ kọwakwara arụ dị iche iche ndị omekome ahụ kpagara, bụ nke gụnyere otu ha siri tọrọ ụmụejima eze ọdịnala, ma mechaa gbahapụ ha rie mbọ mbọ ọsọ, ka a wakporo ha ma chụọ ha ọsọ. 

 N'okwu nke ya, otu n'ime ndị ahụ a zọpụtara n'aka ndị ntọrị ahụ, aha ya bụ Isiaka Awoyemi kwuru sị: "Abụ m onye steeti Kwara. Ha tọọrọ m ma kpọrọ m gaa n'ime ọhịa ebe ha chọrọ igbu m. Ebe ahụ, ahụrụ m ozu mmadụ tinyere onye nke e bepụrụ isi. Anọ m na-ebe akwa maka enyemaka ma na-arịọ ha ka ha tọhapụ m; ma ha nọ na-ekwu ka ezinaụlọ m nye ha nde naịra abụọ. Ọ dị mmadụ ise ha ji eji ebe ahụ. Ha na-atọrọ ma na-egbu ndị mmadụ, jiri ha na-agwọ ọgwụ ego."

N'ịga n'ihu, o kwuru na ha nọkatara nụba ụda egbe nke mere ka ndị ntọrị ahụ gbahapụ ha gbaa ọsọ; ha wee bido tibe mkpu enyemaka nke mere ka ndị uweojii mata ebe ha nọ, ma zọpụta ha. O kwuru na ha nọrọ abalị anọ n'ọhịa ahụ.

 N'akụkụ nke ya, otu onye ntọrị, Alede James kwuru na ya na-atọ ma na-egbu ndị mmadụ maka ọgwụ ego. Dịka o siri kwu, o gbuo onye ahụ, o lie ozu ya were chọbazie ndị ga-egokọrọ akụkụ ahụ ya dị icheiche. O kwuru na ha na-ebu ụzọ napụta ezinaụlọ onye ahụ ego tupu ha agakwaa n'ihu gbuo ya. 

Kọmishọna Assayomo kwuru na agaghị agbachi nkịtị ka ndị omekome ghasaa udo tọrọ atọ dị na steeti Kwara. Ya mere, o kwuru na a ga-akpụpụ ndị ahụ niile ụlọikpe mgbe adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484