N'Awka, Dayọsiisi Ụka Angịlịkan Echiela Ndị Dikin Ọhụrụ

Jul 6, 2021 - 22:33
Jul 6, 2021 - 22:37
 0
N'Awka, Dayọsiisi Ụka Angịlịkan Echiela Ndị Dikin Ọhụrụ


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụnnọọ oge ọñụ na oge inye ike maka ije oziọma, dịka Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chiri mmadụ anọ dikìn (Deacon) ma nyekwa ha ikike ije ozi dịka ndị nchụaja Chineke.

Mmemme ichi ụkọchukwu ahụ bụ nke e mere n'ofufe nro pụrụ iche weere ọnọdụ n'ụlọụka St. Peter’s Church' dị n'Amawbia dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dị ọrụ ụka nà ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche sonyere na ya.

Ụkọchukwu anọ ahụ e chiri ọhụrụ gụnyere Eistein Emone, Echezona Chizualum, Stanley Nweke na Nnamdi Nwokoye, ma bụrụkwa ndị sitere ụlọụka 'Anglican Church of Advent, dị na Nkpor-Uno; ụlọụka 'Immanuel Church' dị n'Adazi-Enu; 'St James Anglican Church, Awkuzu' na ụlọụka 'All Saints Anglican Church, Nibo' n'otu n'otu.

N'okwuchukwu ya n'ofufe nro ahụ nke isiokwu ya bụ "Ihe Ọ Na-Ewè Iso Ụzọ Kraịstị", Ashịdikin nke Nibo Ashịdikinri, bụ Venerebụlụ Goodness Amaechi kọwara na a na-echi ndị ụkọchukwu ma na-ezipụkwa ha n'ime ụwa iji gbasàá oziọma, kụtara Kraịstị mkpụrụ obi, mee ka ibu dịrị ndị mmadụ mfe, ma gwakwa ụwa eziokwu, ọkachasị dịka o siri metụta alaeze eligwe.

O kwuru na mmadụ ga-abụrịrị onye a mụrụ ọzọ tupu o nwee ike ịbụ onye na-esò ụzọ Kraịstị, ma kpọkuo ndị ụka ka ha ñomie ezi ndụ Kraịstị biri site n'ubuli obe ha ma sobe ya, na-agbasokwa nzọụkwụ ya, iji soro ya wee chịa eze n'eligwe n'ụbọchị ikpeazụ.

Ọ kọwara na ichi ma zipụ ndị ọrụ ụka abụghị ka ha ga were oziọma wee chụba ego, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha na-akwàdo ndị ọrụ ụka ma na-ekpekwara ha ekpere, iji rụzupụta ebumnobi ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ha, maka na ya bụ ọrụ abụghịkwanụ ihe dị mfe.

N'okwu ya nye ndị ọrụ ụka ahụ e chiri ọhụrụ, Ashbishọọpụ mpaghara Naija ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Ọka, Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chètààrà ndị ahụ na ọrụ ha gụnyékwàrà idebe ụka, inyere ụkọchukwu ndị ọzọ nọ n'ụlọụka e zigara ha aka n'ọrụ, inye aka n'ịhazi ọrụ ụka, tinyere ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ dịịrị ha. Ọ gwara ha ka ha were égwù Chineke wee jee ozi, bụrụ ndị na-eweta udo na ịhụnanya, mee ka mkpụrụ obi na-efu èfu laghachikwute Kraịstị, ma zisakwara ụwa oziọma ahụ a kụghị mmiri.

Ọ gwara ha na ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ha bụ ka ha jeere Ya ozi ma rụọrọ ya ọrụ dịka ndị ọzụzụ atụrụ, gwakwa ha ka ha si n'ọnụ ha na n'omume ha zisàá oziọma Kraistị.

Ashbishọọpụ Ibezim dụkwàrà ndị ahụ ọdụ ka ha were ịhụnanya wee jeere Chineke ozi, ma bụrụkwa ndị Chineke ga-agbara ama ezi ọrụ ha rụrụ dịka ndị ozi ya n'ụbọchị ngụkọ, maka na mmadụ ọbụla ga-azarịrị ajụjụ banyere etu o siri gaa ozi ya nakwa etu o siri chịkwaa ìgwè atụrụ Chineke hanyere n'aka ya.

N'okwu ya n'aha ndị ọzọ, otu onye n'ime ndị ahụ e chiri dikin ọhụrụ, bụ Dikin Stanley Nweke kèlèrè Chineke maka mbulinọkwa ahụ, kelekwa Bishọọpụ Ibezim maka ịhụta ha dịka ndị tozùrù oke, ma rịọkwa amara, nchekwa na enyemaka Chineke, na nkwàdo na ekpere ụmụ mmadụ, iji nyere ha aka ịga ozi ha nke ọma n'ikwesi ntụkwasịobi, bụkwa nke o kwere nkwa na ha ga-eme.

Onye ndu òtù ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ na dayọsiisi ahụ nakwa na mpaghara Naịja, bụ Oriakụ Chioma Ibezim na ọtụtụ ndị ọzọ sonyèkwàrà na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484