Ndị Ụka Angịlịkan Emeela Ekpere Pụrụ Iche Maka Ọnọdu Nchekwa, Nhọpụta Ọkwa Gọvanọ Anambra

Oct 27, 2021 - 22:02
Oct 27, 2021 - 22:04
 0
Ndị Ụka Angịlịkan Emeela Ekpere Pụrụ Iche Maka Ọnọdu Nchekwa, Nhọpụta Ọkwa Gọvanọ Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ

Nnukwu ọgbakọ ekpere pụrụ iche ewerela ọnọdụ n'ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka (Ọka) bụ isi obodo steeti Anambra maka ọnọdụ ala Nigeria, ọnọdụ nchekwa, nà nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a na-akwadobe ime na steeti Anambra n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

Ọgbakọ ekpere ahụ a kpọrọ '2021 Anambra State Anglican Prayer Rally' bụ nke a chịkọbara site n'aka ndị ụka Angịlịkan n'ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị òtù ụka Angịlịkan sitere dayọsis iteghete mejupụtara mpaghara Naịjà (Province of the Niger); ndị ọrụ gọọmenti, ndị ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche esonye n'ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu ọ gwara ọhaneze sonyere n'ọgbakọ ekpere ahụ, Ashbishọọpụ mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsis Awka, bụ Ashbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim kọwàrà na isiokwu mmemme ahụ, nke pụtara "Dị̀ Ike n'Ime Onyenweanyị" (ma a sụgharịa ya) bụ nke magburu onwe ya ma bụrụkwa nke dabàrà àdábà mà e lekwàsị anya na nsogbu dị icheiche na-adakwàsị ụmụ mmadụ nà ihe ndị na-emegasị n'oge ugbua. Ọ kpọkukwazịrị ndị otu Kraịst ka ha dị ike n'ekpere, ma chọkwa ihu Chineke, iji merie nsogbu, ihe icheakamgba, na ihe ọdachi ndị ọzọ jupụtara n'oge ugbua.

Na mbụ n'okwuChukwu ya n'ọgbakọ ekpere ahụ, Bishọpụ Johnson Ekwe nke dayọsis 'Niger West' gosipụtara mgbakàsịahụ o nwere banyere etu ndị ndu ala Nigeria na ndị ndu Igbo siri gba nkịtị ma dàá ogbi n'ihe gbasaara mmekpàáhụ ahụ a na-emekpà ndị Igbo, ọkachasị n'etu e si ekesà ihe na ọrụ ngō n'ala Nigeria; o wee dịzie ka a ga-asị na ọ bụghị mmadụ nwe ọgọdọ̀ ewu na-ata. Ọ katọkwara ajọ ọnọdụ nchekwa na oke ịkwafu ọbara dịzị n'oge a, nke na a na-egbuzị ụmụ mmadụ dịka ọkụkọ kwà ụbọchị, ma kọwaa ya dịka ihe jọgburu onwe ya.

Kaosiladị, o kwuputara nkwụdosiike ndị ụka nà olileanya o nwere na ekpere nà ịchọ ihu Chineke pụ̀rụ̀ ígbò nà iwètà n'isi njedobe, ihe icheakamgba niile ahụ na-adakwasị ala Nigeria na steeti Anambra n'oge ugbua, ma kpọkukwazie ndị ụka ka ha jisie ike n'ekpere.

N'okwu nke ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority,(ACTDA)' bụ Venerebụụl Amaechi Okwuosa, kọwàrà mkpa ọ dị ịhọpụta na iguzobe onyendu na-atụ egwu Chineke dịka gọvanọ steeti ahụ na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme n'ime steeti ahụ n'ọnwa ọzọ. O kwukwara na nke ahụ ga-enye aka ibulikwu steeti ahụ nà ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ n'ogoogo dị elu.

Dịka ọ na-agba akaebe na Chineke nọnyèèrè ya ma bụrụkwa onyeisiụgbọ n'ọchịchị ya, ya bụ Gọvanọ jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo Ndị Anambra ka ha pụta n'ìgwè wee sonye na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme n'ọnwa ọzọ n'ime steeti ahụ n'enweghị egwu ọbụla.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyenhazi ọgbakọ ekpere ahụ, bụ Maazị Chinedu Ike, na nwunye Ashbishọọpụ Ibezim, bụ Oriakụ Martha Ibezim kwupụtara afọojuju ha banyere etu ndị mmadụ siri pụta n'ùjú wee sonye n'ọgbakọ ekpere ahụ. Ha kwukwazị̀rị̀ na nke ahụ bụ ihe ngosi na ihe ịgba àmà na Chineke kwàdòrò ya bụ ọgbakọ ekpere ma zakwa ekpere dị icheiche e kpere n'ebe ahụ; ọbụladị dịka ha kpọkukwara Ndị Anambra ka ha gbasoo usoro udo na ịhụnanya wee mee nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a na-akwadobe na steeti ahụ.

Mmemme ahụ dọtàkwara onyeisi òtù 'Evangelical Fellowship in the Anglican Communion (EFAC)' n'ala Nigeria ma bụrụkwa Bishọọpụ Dayọsis Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor; onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Accord' were azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, bụ Dọkịta Godwin Maduka; onye nke ji aha otu ndọrọndọrọ 'All Progressives Grand Alliance (APGA)' were azọkwa ya bụ ọkwa, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, tinyere ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti na ndị ndu ụka.

A nọkwara n'ebe ahụ wee kpee usoro ekpere dị icheiche, bute ma chee nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme n'Anambra n'ihu Chineke, kpee ekpere banyere ajọ ọnọdụ nchekwa, igbusi mmadụ, na mmekpaahụ a na-emekpà ndị Igbo n'ụdị n'ụdị ọbụla n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484