Bishọọpụ Ezeofor Adụọla Ndị Mmadụ Ka Ha Kwụsị Ịgba Ọsọ n'Iso Kraịst

Jul 16, 2021 - 19:12
 0
Bishọọpụ Ezeofor Adụọla Ndị Mmadụ Ka Ha Kwụsị Ịgba Ọsọ n'Iso Kraịst

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola ma dụọ ndị ụka ka ha kwụsị inye mkpesa enweghị isi na ọdụ n'ihe banyere iso ụzọ Kraịstị na ijere Ya ozi oge ọbụla a kpọrọ ha.

Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor bụ ya nyere ndụmọdụ a n'okwuchukwu ya n'ofùfè nrò ịkwọ aka n'isi nà ịkpọbàtá ndị mmadụ n'òtù dị iche-iche, bụ nke ọ gara mee na nsonso a n'ụlọụka 'St. Peters Church Lomu Umunze' dị n'okpuru ọchịchị 'Orumba South' nke steeti Anambra.

Dịka ọ na-akọwa iso ụzọ Kraịstị dịka ihe dị oke mkpa maka onye ọbụla chọrọ ịbà alaeze Chineke, ọ kpọkuru ndị ka na-agba ọsọ n'iso ụzọ Kraịstị n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ ma dụọ ha ọdụ ka ha gharakwa ikwe ka ihe ọbụla gbochie maọbụ dọghachi ha azụ n'iso ụzọ Kraịstị, bụkwa nke mmadụ apụghị ime ma ọ bụrụ na onye ahụ ebughị ụzọ nabata Chineke dịka onye nwe ya na onye nzọpụta ya.

O kwuru na Kraịstị bụ Ọkpara Chineke O zitere n'ụwa maka ịzọpụta ụwa na mmehie na iwetere mmadụ ntọpụ n'agbụ, ọbụladị dịka o chetaara ndị na-agba ọsọ n'iso ụzọ Kraịstị, ije ozi Chineke na ịza ọkpụkpọ oku ya n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ na Chineke agaghịkwa anabata ihe dị etu ahụ maka na onye na-eme ihe dị etu ahụ enweghị ngọpụ ọbụla dịịrị ya.

Bishọọpụ Ezeọfọ jikwàzịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị nọ n'ọkwa ọchịchị dị iche iche ọdụ ka ha gharakwa iji ọkwa ọchịchị ha nọ na ya wee na-emegide mmadụ ibe ha, kama ka ha were ya wee wèta ezi mgbanwè n'obodo, jiri ya mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, ma jiri ya cheta ndị ọnọdụ dịịrị añaa. 

Ọ dụkwazịrị ọhaneze bịara ụka ahụ ndị anabatabeghị Kraịstị ka ha nabata ma nye Ya ohere na ndụ ha, n'ihi na ọ bụ naanị site n'ime nke ahụ na iso nzọụkwụ Ya ka ha ga-esi wee keta òkè n'alaeze eligwe n'ụbọchị ikpeazụ.

N'okwu ha n'otu n'otu n'ebe ahụ, onye Ashịdikin nọ n'isi Ashịdikinri ahụ, bụ Venerebụụl Nwachineke Ekwueme, na ụkọchukwu nọ n'isi ụlọụka ahụ, bụ Ụkọchukwu Justin Anyaogu kpọkuru ndị ụka ka na-enyefègharị ndụ ha n'aka Chineke, tụkwasị okwukwe ha niile n'ebe Chineke nọ, ma kwesiri Ya ntụkwasịobi oge niile, n'agbanyeghị ọnwụnwà na ihe iche aka mgba niile ha na-agabiga, ya na etu ihe siri sie ike ugbua.

Ọnụọgụgụ ndị e bikwasara aka n'isi ụbọchị ahụ dị mmadụ otu narị na atọ; ọnụọgụgụ ndị a nabatara n'otu ụmụagbọghọ dị iri anọ na anọ, ebe ọnụọgụgụ ndị a nabatara n'otu ụmụnwaanyị dị iri isii na asaa

A nọkwazịrị n'ofufe nro ahụ wee nabata mmadụ anọ n'òtù ndị nna na dayọsiisi ahụ, tinyekwuoro abụ otuto dị iche iche a bụrụ site n'ọnụ ndị ọbụabụ, na ịtụ mmamma na ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ ụka jupute n'ebubè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484