Ụmụnwaanyị Akpọkuola Onyeisiala Ka Ọ Kwàlite Ọnọdụ Ncheka

Jul 5, 2021 - 20:46
 0
Ụmụnwaanyị Akpọkuola Onyeisiala Ka Ọ Kwàlite Ọnọdụ Ncheka

Izunna Okafor, Awka


A kpọkuola onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari ka o welitekwuo aka n'ọrụ na mbọ ahụ a na-agba imemilà ajọ ọnọdụ nchekwa na-arịzị ibe ya elu n'ala Nigeria ugbua, ma dụọ ya ọdụ ka o weghàchite ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria, site n'ime ka nchekwa bụrụ ihe mbụ ọ na-elebara anya n'ọchịchị ya.

Ụmụnwaanyị ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka bụ ha kpọrọ òkù a na nnukwu mmemme ha chịkọbara na nsonso a, a maara dịka 'Anglican Diocesan Women Conference (ADWOC)' nke ahọ 2021. Mmemme ahụ isiokwu ya bụ 'Aha Jehova Bụ Ebe Ụlọelu Dị Ukwu' bụ àgbà nke iri atọ na ise, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Mark's Church, Aguluzigbo' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anocha nke steeti Anambra. 

N'ozi pụrụ iche ọ gụpụtàrà na mmemme ahụ, onyeisi otu jikọtara ụmụnwaanyị, ndị nne na ụmụagbọghọ na mpaghara Naịjà, bụ Oriakụ Martha Chioma Ibezim katọrọ etu ndị Fulani na-achị ehi si enye nsogbu, na-egbusi mmadụ, ma na-emekwa mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ugbua, ma kọwaa ya dịka isi sekpụ ntị na nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na ụkọ nri ahụ ala Nigeria na-agabiga ugbua.

Oriakụ Ibezim, onye bụkwa nwunye Achbishọọpụ Mpaghara Naija bụ Achbishọọpụ Alexender Chibuzor Ibezim gàrà n'ihu kọwaa na ala Nigeria alaghachila azụ nke ukwuu n'ihe metụtara nchekwa ndụ na akụnụba, n'ihi na a na-egbuzị ndị mmadụ n'ìgwè ugbua kwà ụbọchị na mpaghara ala Nigeria niile taa.

Ọ kpọpụtàsịrị ọtụtụ uru dị iche iche nchekwa dị n'obodo ọbụla, ma mee ka a mara na nchekwa so n'ọrụ mbụ dịịrị gọọmenti obodo ọbụla, ma kwuzie n'ebe o doro anya na o nweghị mmepe, ọdịmma maọbụ ezi ihe ọbụla na-abata n'obodo ọbụla enweghị ezi ọnọdụ nchekwa. Ọ kpọkuzịrị isi ọchịchị ala Nigeria ka ha mara ihe e mere banyere ọnọdụ ahụ, karịa ịgbachị nkịtị ka a gaa n'ihu na-egbusi mmadụ ka ọkụkọ.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ kèlèrè Achbishọọpụ Ibezim na nwunye ya maka ezi ọrụ dị iche iche ha rụgoro, ọkachasị n'ịkwàlìtè na ịkwàdò ụmụnwaanyị site n'ịkụziri ha ọrụ aka dị iche iche, ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n'ọrụ. 

Oriakụ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ụlọọrụ 'Post Primary Schools Service Commission' na steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Joy Ụlasị, gwàrà ụmụnwaanyị ahụ ka ha welitekwuo aka n'ekpere ha na-ekpere ala Nigeria na steeti Anambra, n'ihi na ala Nigeria nọ na nnukwu nsogbu ugbua, bụkwa ọnọdụ ekpere na ụmụnwaanyị dị uchu nwèrè ike ịgbanwè. O chetàkwààrà ha na ụmụnwaanyị nwere ọtụtụ ọrụ dị iche iche dịịrị ha n'ịkwàlìtè ọdịmma na mmepe obodo; ma kpọkuzie ha ka ha bụrụ ezi nwaanyị na-ewulite obodo ewulite karịa ịbụ ndị na-akwada akwadà.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị, bụ Ndidi Mezue kelere ụmụnwaanyị ahụ maka ịchịkọba nnukwu ọgbakọ ahụ kwà ahọ ọbụla, ma gbaa akaebe na ya bụ mmemme amịtala ọtụtụ mkpụrụ n'ụzọ dị iche iche, jaa ha ike.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ụka e jiri màlite mmemme ahụ, Achbishọọpụ Ibezim dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha bụrụ ezi nne ma na-arụkwa ọrụ dịịrị ha n'ezinụlọ ha na n'ịzụlite ụmụ ha n'ụzọ kwesiri ekwesi, ma gwa ha ka ha nyòchagharịa ndụ ya, iji hụ na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nke ukwu, iji wee soro na ndị ga-eketa òke n'alaeze ya n'ụbọchị ikpeazụ maka na ọ bụ nke ahụ bụ ihe kacha mkpà.

A nọrọ na mmemme ahụ mee emume ibuputè akwụkwọ a kpọrọ Christian Family Magazine, ịgụpụta edemede banyere Ezinne Hannah Adogu gbara ahọ iri iteghete na iteghte, ịwa achịchà bekee e jiri mee ya bụ mmemme, ịbụ abụ olu ọma dị iche iche, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ mmeme dàá ụdà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484