Ọmụmụ Ihe Wikipedia Igbo Abịala Na Njedobe n'Awka

Apr 2, 2021 - 17:33
 0
Ọmụmụ Ihe Wikipedia Igbo Abịala Na Njedobe n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọgbakọ nkụzi mkpụrụ ụbọchị abụọ banyere etu e si ede, etinye, emezi maọbụ atụgharị edemede na Wikipedia Igbo abịla n'isi njedobe, dịka a kpọkuru ndị Igbo ka ha teta n'ụra ma bido ịkọ akụkọ ha na ide ihe banyere ha, karịa ịhapụrụ ya ndị mba ọzọ ka ha deere ha.

Ya bụ ọgbakọ nkuzi, nke a kpọrọ 'Ọzụzụ Igbo Wikupedia Awka' bụ nke weere ọnọdụ n'izuụka a n'ọba akwụkwọ steeti Anambra dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ, ndị nkụzi, ndị nta akụkọ, ndị odee, ndị ọrụ oyibo, ndị ntorobịa, na ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye nhazi òtù 'Igbo Wikimedian User Group' na steeti Anambra, bụ Oriakụ Onyinye mere ka a mara na ebumnobi ya bụ ọgbakọ bụ iji nye ndị mmadụ nkụzi na mgbàzi banyere etu ha ga-esi na-etinye ihe na Wikipedia, site n'idegharị, ịtụgharị, idenye maọbụ ibipụta edemede ọhụrụ na Wikipedia, ọkachasị n'asụsụ Igbo.

O mere ka a mara na Wikipedia, nke e wepụtara n'ahọ 2001 bụ ebe mmadụ pụrụ isi jiri usoro ịtaneetị wee chọpụta maọbụ nweta ihe dị iche iche dịka ọgụgụisi, ozi, maọbụ mmụta n'efu site na mpaghara ebe ọbụla n'ụwa gbaa gburugburu, nakwa site na ngalaba atụmatụ ọrụ Wikipedia dị iche iche, nke gụnyere Wikitionary, Wikibooks, wikiquote, Wikinews, Wikiversity, Wikispecies, Wikivoyages, Wikisource, Wikimedia Commons, and Wikidata.

Dịka o siri kọwaa, Wikipedia nwere edemede karịrị ndè iri ise (50 million) n'asụsụ karịrị narị atọ na iri abụọ (320), ma nwekwa ndị na-eme ihe na ya oge ọbụla (active users) ọnụọgụgụ ha ruru narị puku atọ, iri anọ na ise, na narị asatọ na iri na abụọ (345,812). 

N'ime mkpokọta ọnụọgụgụ niile ahụ, Oriakụ Ọnụọha mere ka a mara na Wikipedia bekee (English Wikipedia) nwere edemede ruru ndè isii, narị puku abụọ na iri asaa na iteghete, na narị atọ na iri na isii (6,279,316), ma nwee ndị na-eme ihe na ya oge ọbụla (active users) ruru otu narị puku na iri anọ na abụọ, na narị iteghete na iri abụọ na iteghete (142,929); ebe Wikipedia Igbo nwere naanị edemede ruru puku abụọ na otu narị na anọ (2,104), ma nwee ndị na-eme ihe na ya oge ọbụla (active users) ruru naanị iri anọ na otu n'ọnụọgụgụ.

O kwuru na ọ bụ nke ahụ mere o jiri dị mkpa na a chịkọbara ya bụ ụdị ọgbakọ nkụzi, iji wee kụziere ọtụtụ mmadụ etu e si ede maọbụ na-agbàzi edemede na Wikipedia Igbo, iji wee kwalitekwuo ọnụọgụgụ ndị na-etinye ihe na ya, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ọnụọgụgụ edemede dị ebe ahụ.

O chetazịkwaara ọhaneze sonyere n'ọgbakọ nkụzi ahụ na ọ bụ ha bụ ndị Igbo ka ọ dịịrị ide ihe banyere ha, n'ihi na ndị ọcha agaghị ahapụ asụsụ ha bịa na-edere ndị Igbo nke ha. N'ihi nke ahụ ka ọ kpọkuru ma dụọ ha ọdụ ka ha were ohere ọma ahụ kpọrọ ihe, ma malitekwa tụnyebe ụtụ nke ha n'ide ihe n'asụsụ Igbo, ọkachasị na Wikipedia.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, ụfọdụ ndị so ahazi ya bụ ọgbakọ nkuzi, nke gụnyere, Dọkịta Nkem Osuigwe, onye bụ onyeisi ọba akwụkwọ Anambra n'oge mbụ; na onye ọrụ ọba akwụkwọ bụkwa onye nkuzi na mahadum, bụ Oriakụ Ngozi Osuchukwu, gbarụrụ ihu banyere ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya taa, ma kpọokuzie ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ ka ha tinye ihe niile ha mụtara ebe ahụ n'ọrụ ma na-emekwa ya oge niile, iji soro nye aka ma tụnye ụtụ nke ha n'ichekwaba na n'ịgbasara mba ụwa ozi banyere omenala, asụsụ, na ọnatarachi dị iche iche ndị Igbo nwere, na ihr ndị ọzọ Chukwu jiri chọọ ha mma.

N'akụkụ nke ya, otu onye n'ime ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ, ma bụrụkwa onyeisi ọba akwụwkọ steeti Anambra, bụ Oriakụ Nkechi Udeze, kèlèrè ndị chịkọbara ya bụ ọmarịcha ọgbakọ nkụzi, ma kpọọ òkù ka a na-achịkọba ya bụ ọgbakọ na mgbe na mgbe, iji mee ka ihe ahụ a kụziri dị n'uche ha mgbe niile, ebe ha ga na-etinyekwa ihe niile ha mụtara n'ọrụ, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ nye aka n'imezupụta ebumnobi e jiri hibe ọgbakọ nkụzi ahụ.

E wezuga ihe ndị ọzọ e mere ebe ahụ, a nọrọ na mmemme ahụ wee kụziere ndị sonyere na ya etu e si esonye na Wikipedia, ya na etu e si atụgharị, edezigharị ma na-ebipụtakwa edemede n'asụsụ Igbo na Wikipedia.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484