Taa ka a na-edu Barack Obama n’iyi-olu

Taa ka a na-edu Barack Obama n’iyi-olu

Jan 22, 2013 - 05:37
Jan 20, 2021 - 05:37
 0
Taa ka a na-edu Barack Obama n’iyi-olu

Ndị mba Amerịka eduona Barack Husain Obama n’iyi-ọlụ maka ịmalite agba nke abụọ ọchịchị ya. Obama na-achị Amerika kemgbe afọ anọ. N’usoro akwụkwọ iwu mba ahụ, onye isi ala na-achị afọ anọ. Afọ anọ ahụ gafee, o nwere ike iso me ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụrụ n’o nwee mmeri, ọ ga-achị afọ anọ ọzọ. Nke a pụtara n’onye isi ala nwere ike ịchị nanị afọ asato na mba ahụ.

Barack Obama malitere agba nke mbụ ọchịchị ya n’ụdị oge a n’afọ 2009, ka o meriri ogbo ya bụ John McCain, onye jiri aha ndị Rịpọblikan zọ ọkwa onye isi ala n'afọ 2008.

Ka agba nke mbụ ọchịchị ya na-erute n’isi njedebe, Obama weputere onwe ya maka iji aha ndị otu Demokrat azọ ọkwa, n’ọnwa Nọvemba afọ 2012. Ndị otu Demokrat kwadosiri ya ike, na-agbanyeghị na ha emezichaghị ọnọdụ akụ n’ụba mba ahụ otu ha siburu chee.

Aka chịburu Steeti Massechussets, Mitt Romney, bụ onye ndị Rịpọblịkan họpụtara ka o cheere Obama aka mgba. Igbo sị na mbe na mbe pụta, e nwere nke bụ oke mbe. Barack Obama meriri Romney n’ụdị Romney na ndị Rịpọblịkan na-atụwaha anya, mgbe ndị Amerịka mere ntụli-aka ozuru ọha, n’abalị 6 nke ọnwa Nọvemba afọ 2012.

Taa bụ abalị 21 nke ọnwa Jenụwarị ka onye isi ulọ-ikpe ukwu nke mba Amerịka, John Robert (jr), duru Obama n’iyi-ọlụ. Ọ ga-achịgide Amerịka ruo na ngwụsị afọ 2016.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.