N'Anambra, Otu Ụgbọala Asụnyela Isi n'Ọwà Mmiri

Mar 12, 2021 - 12:09
 0
N'Anambra, Otu Ụgbọala Asụnyela Isi n'Ọwà Mmiri

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu ụgbọala 'Nissan Xterra Jeep' enweela ihe mberede okporoụzọ, wee sụnye isi n'ọwà mmiri n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Onye mere ka ụwa mara nke a bụ SRC Florence Edor, bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' (FRSC), ngalaba steeti Anambra, site n'ozi ọ kọpụụrụ ndị nta akụkọ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra bànyere nke ahụ.

O kwuru na ihe mberede ahụ dapụtara n'okporoụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke mere oge onye na-anyà ụgbọala (nwéré ákàrà efere ENU 612 AE), bụ Maazị Osita Obi chọrọ ka o zèére ụgbọala ọzọ si n'akụkụ ebe ekwesighị ekwesi wee kwòró ọsọ na-abịa na ncherịta ihu ya; ụgbọala ya wee dakpuo n'ime ọwà mmiri dị n'akụkụ ụzọ ahụ, ebe ọ na-ezè ya bụ nwoke na ọnwụnwa ya.

SRC Edor mezịrị ka a mara na e nweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ nweta mmerụahụ ọbụla na ya bụ ihe mberede okporoụzọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ CC Andrew A. Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị banyere imegide maọbụ inupù isi nye iwu na-achị okporoụzọ, bụ nke o kwuru na ọ na-ewèta ọtụtụ ihe mberede okporoụzọ n'ụdị dị icheiche.

Dịka ọ na-echetara ndị na-anyà ụgbọala na onye ọbụla e jidere ka ọ na-enupu isi n'iwu na-achị okporoụzọ bụ onye dara nnukwu iwu, ma bụrụkwa onye a ga-ádà nha puku naịra ise maọbụ a tụọ ya nga ọnwa isii, maọbụkwanụ e mee ya ihe abụọ ndị ahụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484