Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines

May 11, 2024 - 11:01
 1
Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ihe onyonyo na-atọ ọchị ma dịkwa mma nkiri agbasaala n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, na-egosi otu nwoke Igbo bi na mba Philippines ka ọ na-akụziri ụfọdụ ụmụaka obodo ahụ ka e si asụ asụsụ Igbo.

Nwaafọ Nigeria ahụ, bụkwa onye na-eti egwu, Maazị Daniel Okafor (nke e ji Dandy Best wee mara) bụ̀ onye Ụmụdiala dị n'Ezinifite, n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye a hụrụ n’okporoụzọ dị na mba Philippines ahụ dị na mpaghara Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Eshia, ka ọ na-akụziri ụmụaka nọ ebe ahụ ka e si asụ, agụ ma na-akpọpụ̀ta okwu na ahịrịokwu Igbo.

Ihe onyoonyoo ahụ pụtara na nsonso a gòsịkwàrà ya bụ nwa amadi ka o ji Igbo primer akwụkwọ mkpụrụedemede, okwu na ahịrịokwu Igbo, bụ nke o ji akụziri ha ka e si akpọ ma na-agụ okwu Igbo.

N'okwu ya tupu ọ malite, ọ kọwàrà na ndị Igbo gaa n'ụfọdụ mba ndị ọzọ, na a na-amanye ha imụ̀tà asụsụ mba ahụ, nke na bụrụ na ha amụtaghị ya, ị mara na agụụ ga-afịọ ha ọnụ n'obodo ahụ.

“Ya mere, taa, achọrọ m ịkụziri ndị Philippines ka e si asụ asụsụ m — asụsụ Igbo. Ha ga-asụ Igbo. Ndị ọcha ga-asụrịrị Igbo taa. Ndị Philippines ga-asụrịrị Igbo,” ka o kwuru, dịka ọ na-egosipụtakwa akwụkwọ mkpụrụedemede Igbo ahụ, iji gosi na ọ dị nkwadobe wee gaa.

Mazị Okafor gosikwara otu narị peso (ego Philippines), bụ nke o kwere nkwà inye dịka ihe nrite nye nwata ọbụla nwetara mkpọpụta maọbụ ngụpụ̀ta ahịrịokwu Igbo ọbụla nke ọma.

Kaosiladị, oge nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo ahụ bụ nke tọrọ ọchị, dịka ụmụntakịrị Philippines na-ataghèri ọnụ n'ịkpọpụta ụfọdụ okwu Igbo na iji ha mee ahịrịokwu, dịka “Aka”, “E ji aka eri ihe”, “Ada na-agba ọsọ” , “Dinta ji egbe achụ anụ”, wdg.

Lee ka o siri mee:

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484