Obianọ Achọọla Ụfọdụ Ndị Uweojii Muhammed E Buliri n'Ọkwa Ọhụrụ Mma

Apr 2, 2021 - 17:54
 0
Obianọ Achọọla Ụfọdụ Ndị Uweojii Muhammed E Buliri n'Ọkwa Ọhụrụ Mma

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọ na nsonso a, wee chọọ ndị uweojii abụọ e buliri n'ọkwa ọhụrụ na steeti ahụ mma, bụ ndịisi òtù nkwụkọ ụgbọala na-eso gọvanọ na nke na-eso nwunye ya.

Mmemme ịchọ mma ahọ bụ nke Gọvanọ Obianọ mere na be ya dị n'Aguleri, n'okpuru ọchịchị 'Anambra East', ma bụrụkwa nke ọ bụ ya na nwunye ya bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ jikọrọ aka wee mee.

Ndị uweojii ahụ e buliri n'ọkwa ọhụrụ gụnyere Toro Muhammed, bụ onyeisi òtù nkwụkọ ụgbọala na-eso gọvanọ, ma bụrụkwa onye e siri n'ọkwa 'Inspector' bulie n'ọkwa 'Assistant Superintendent of Police' (ASP); na Casmir Afoejuonwu, onyeisi òtù nkwụkọ ụgbọala na-eso nwunye gọvanọ, ma bụrụkwa onye e siri n'ọkwa 'Inspector' bulie n'ọkwa 'Assistant Superintendent of Police (ASP).'

Gọvanọ Obianọ nọkwara n'ebe ahụ ozigbo wee nye DSP Ikechukwu Nome ọrụ ozigbo ozigbo, bụ onye lara ezumike nka n'ọrụ uweojii ụbọchị Wenezdee ahụ, ka ọ rụchaara ọrụ iru ruru ahọ iri atọ na ise zuru èzù.
Ya bụ onye uweojii lara ezumike nka n'ọrụ ka e kwuru na ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe na na ngalaba dị iche iche kemgbe ọchịchị Willie Obiano batara n'ọkwa ọchịchị, nke gụnyere iji ọkwa dịka onyeisi òtù nkwụkọ ụgbọala na-eso gọvanọ, onyeisi òtù ndị uweojii na-elekọta ebe ahụ a na-arụ ọdụ ụgbọelu Anambra, dị Ụmụeri, tinyere ọtụtụ ebe ndị ọzọ o jigoro ọkwa dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484