N'Anambra, Otu Onye Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Oct 8, 2021 - 22:02
 1
N'Anambra, Otu Onye Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ozi si n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele n'okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na otu nwoke anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà  n'ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Ihiala gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke mere n'elekere abụọ nke ehihie ụbọchị Tuzdee.

O kwuru na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'etiti onye na-anyà nnukwu ụgbọala 'An Iveco Trailer' (enweghị ákàrà), na nnukwu ụgbọala Mack na-ebu mmanụ (enweghị ákàrà).

DRC Onabe gara n'ihu mee ka a mara na ihe mberede okporoụzọ ahụ mètụtàrà mmadụ anọ, ndị bụ naanị ụmụnwoke, ma kwukwa na otu nwoke n'ime ha nwụrụ, ebe ụmụnwoke atọ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ụdị dị icheiche n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ọ bụ ịgba oke ọsọ ka e kwuru na ọ bụ ya kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ. Ọ sị na ndị ọnọmgbeomere kwuru na onye kọndọktọ nnukwu ụgbọala Mark ná-ebu mmanụ mapụrụ n'ụgbọala ahụ oge ọ malitere ịtụ égwù na ihe mberede okporoụzọ ahụ na-achọ ịdapụta, o wee danye n'okpuru ụkwụ ụgbọala ahụ, o wee kwọrikọọ ya na ndụ.

E burukwazịrị ndị ahụ ihe mberede ahụ metụtara wee gaa ụlọọgwụ 'Our Lady's of Lourdes' dị nso n'ebe ahụ site n'aka ndị ọrụ FRSC na ndị uweojii, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ha ahụ ma gbaa akaebe na otu nwoke n'ime ha, bụ onye ahụ mapụrụ n'ụgbọala ahụ anwụọla. A dọnyezịkwara ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ; ebe ndị ọrụ FRSC na ndị uweojii ahụ gbakwazịrị mbọ bupusie ihe dachisiri ụzọ, iji gbochie inwe agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya banyere ya bụ ajọ ọdachi, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ na uchè na-anyà ụgbọala. 

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na ojinwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ, ọkachasị ugbua a na-achọkwa ịbànye na mmemme ekeresimeesi kpọmkwem.

Dịka ọ na-ekpe ka onye nke nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere ngwangwa, CC Irelewuyi kasikwazịrị ezinụlọ onye nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi onye ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484