N'Osun, Mmadụ 12 Emerụọla Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Jan 22, 2022 - 18:53
 0
N'Osun, Mmadụ 12 Emerụọla Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ ruru iri na abụọ n'ọnụọgụgụ nọrọ n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee wee gbanahị ọnwụ mberede kaara ịdakwasị ha, dịka nnukwu ihe mberede dị oke egwu dapụtàrà na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Ondo wee gaa Ife, na steeti Osun.

Ya bụ ihe mberede okporoụzọ bụ nke dapụtara n'etiti ụgbọala abụọ, nke gụnyere ụgbọala bọọsụ 'Toyota HIACE' ọcha (nwere ákàrà BNJ375XA) na ụgbọala 'Bedford' e ji ebu ibu. Ndị ọnọmgbeomere kọwàkwàrà na ọ bụ ibu óké ibu na ịgba oke ọsọ kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ, maka na ụgbọala abụọ ahụ bùchà oke ibu ma nọrọkwa n'oke ọsọ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka ndị onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze nà ụlọọrụ 'Federal Road Safety Commission (FRSC)' n'ime steeti Osun, bụ Agnes Ogungbemi siri kọwaa, mkpokọta ọnụọgụgụ mmadụ ruru iri abụọ na anọ nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ oge ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara. 

O mekwara ka a mara na mmadụ iri na abụọ n'ime mmadụ iri abụọ na anọ ahọ nwètàrà nnukwu ihe mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche, ma bụrụkwazie ndị e buuru ozigbo gaba n'ụlọọgwụ nnọrọonwe dị nso n'ebe ahụ maka ilekọta ha anya na inye ha ọgwụgwọ.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, otu onye na-ánya ọgbaatumtum nọrọ na nsonso a wee nweta nnukwu mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ dapụtààrà ya n'ogologo okporoụzọ awara-awara ahụ siri  Ikirun gaa Osogbo dịkwa na steeti Osun na mgbede otu ụbọchị Tuzdee ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ Agnes Ogungbemi kọwara na ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara oge ọgbaatumtum Boxer Bajaj ahụ (nwere ákàrà JJJ472QG) nọ n'ọsọ, ụkwụ ya wee gbaa, nke mezịrị ka o buo nwoke ahụ aka, ma tụnye ya otu ebe n'akụkụ okporoụzọ ahụ; o wee nwetekwa ọtụtụ mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche. 

O kwukwara na ndị ọrụ FRSC bùùru nwoke ahụ ozigbo wee gaa ụlọ ahụike maka inye ya ọgwụgwọ na ileru ya anya; ebe e burukwara ọgbaatumtum ya ga debegodi n'ụlọọrụ FRSC.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484