Ọkụ Ime Abalị Agbarikọọla Ngwongwo Ndị Mmadụ n'Anambra

Jan 24, 2022 - 21:22
 0
Ọkụ Ime Abalị Agbarikọọla Ngwongwo Ndị Mmadụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọkụ ọgbụgba ime abalị dabidoro wee gbarikọọ ótù ebe a na-arụ oche na ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji ebi n'ụlọ, dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke dapụtara n'ebe njikọụzọ Seaman dị n'akụkụ ụzọ Stamford e si eje n'isi ụlọọrụ oyibo steeti Anambra dị n'Akwa; ma bụrụkwa nke malitere n'ihe dịka elekere iri na abụọ nke ime abalị, n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Satọdee.

N'okwu ya banyere nke ahụ oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, onyeisi ọrụ nsọnyụọkụ n'ime steeti Anambra, bụ Injinia Martin Agbili kọwàrà na ọ bụ oge o jiri ọ̀kàrà wee gata elekere iri na abụọ ime abalị ka ha nwètàrà òkù na ozi n'ụlọọrụ nsọnyụọkụ ahụ bànyere ya bụ ọkụ ọgbụgba, nke mezịrị ka ọ hazie ndị ọrụ ya ozigbo, ma buru ngwaọrụ ha, gbara, gaba ebe ahụ n'egbughị oge ọbụla.

Ọ kọ̀wàkwàzị̀rị̀ na mgbè ha ruru ebe ahụ, na ọkụ ahụ ebibielarị̀ ọtụtụ ihe dịgasị n'ụlọọrụ ahụ, n'ihi na ihe juru ebe ahụ bụcha ihe na-agba ọkụ, nke mezịrị ka ọkụ ahụ nwusàá ngwangwa. O kwuru na ha gbazịrị̀ mbọ gbanyụọ ozigbo iji gbochie ya inwusà bàá n'ọdụ̀ ahịa, ụlọọrụ, ụlọ obibi ndị mmadụ maọbu ebe ndị ọzọ dịgasị nso na gburugburu ebe ahụ.

Dịka ọ na-ekele ndị mmadụ nà ndị ọrụ uweojii sitere mpaghara ‘B Division’ maka igbata ọsọ na ịnye aka n'ụdị dị icheiche; Injinia Agbili mèrè ka a mara na a kà na-eme nnyòcha iji chọpụta ihe ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ, ya nà ébé o siri màlite wee nwusàá.

O jikwazị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ọhaneze ọdụ ka ha nye aka n'ibelata ọkụ ọgbụgba, ọkachasị n'oge ugbua ihe kpọchara nkụ, bụzị nke na-eme ka ọ dị mfe ọkụ ọgbụgba ịmalitè na inwusà.

O kwuru hoohaa na ụgụrụ anaghị ebu ọkụ ọgbụgba were abịa maọbụ agagharị n'onwe ya (dịka ọtụtụ ndị mmadụ si ahụta oge ụgụrụ dịka oge na-ebukarị ọkụ ọgbụgba); kama, o kwuru na ọ bụ akpachàpụ̀ghị anya nà akpramagwa ndị ọzọ sitere n'aka mmadụ na-ebute ọkụ ọgbụgba, maka na ọkụ ọgbụgba ọbụla dapụtàrà gà-enwerịrị ka aka mmadụ siri dị na ya.

Ọ dụ̀kwàzị̀rị̀ ọhaneze ọdụ ka onye ọbụla na-eke nkwụ̀cha ma na-akpachapụ̀ anya etu ya na ọkụ na ihe gbasaara ọkụ si eje oge niile, gba mbọ na-egbuchasị ahịhịa niile siri n'ọhịa wee tobàta n'ụlọ be ha maọbu n'ụlọọrụ ha (ma gbuchagide ókè ọhịa na ụlọ ruo opekatampe, mità iri), n'ihi nà ahịhịa dị etu ahụ so n'ihe na-emekarị ka ọkụ si n'ọhịa na-enwubàta ma na-agba n'ụlọ be mmadụ nàkwà n'ụlọọrụ ụfọdụ. 

Ka ọ na-ekwupụ̀ta na ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti ahụ nà ndị ọrụ ya nà-anwà ike ha n'ihe gbasaara ibusò ọkụ agha na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, o kwekwàzị̀rị̀ nkwà na ha ga-aga n'ihu n'ezi ọrụ ahụ ha na-arụ na steeti ahụ. Ọ rịọkwazị̀rị̀ ndị Anambra ka onye ọbụla tinye aka n'ọrụ ma tụnyekwa ụtụ nke ha, site n'ime ihe ha kwesịrị ime, iji belata óké ndapụta ọkụ ọgbụgba ahụ na-adapụ̀takarị na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

Ụfọdụ ndị ọkụ ahụ gbarikọrọ ihe ha n'ebe ahụ ụbọchị ahụ, nke gụnyere Maazị Chinwuba Anayo na Maazị Sunday Nwankwo nà ụfọdụ ndị ọzọ nke ahụ metụtara, kwàrà arị̀rị̀ banyere ya bụ ihe, ma kọwaa ya dịka ọnwụnwà nà nnukwu ihe ọdachi, ọkachasị n'ilekwasi anya n'etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri debe imi na ọnụ ugbua.

Ha kọwàrà na o techàbèghị̀ aka ha jiri mefùó ọtụtụ ego iji rụọ, tinye maọbu guzobe ihe ndị ahụ ọkụ gbagwòsìrì ụbọchị ahụ, bụkwa ebe ha si achụta ihe ha na ezinụlọ ha na-eri. Ha rịọkwazị̀rị̀ enyemaka ndị mmadụ, gọọmenti nà òtù dị icheiche, iji nyere ha aka ịmàlitèkwà ndụ ọzọ, n'ihi na ajọ ọdachi ahụ akpụọla ha aka n'ala.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484