Di Na Nwunye Akụnyela Onyenkụzi Ikputu Ọnụ Maka Ịpịa Nwa Ha Ụtarị n'Ụlọakwụkwọ

Jan 21, 2022 - 22:43
Jan 21, 2022 - 23:08
 0
Di Na Nwunye Akụnyela Onyenkụzi Ikputu Ọnụ Maka Ịpịa Nwa Ha Ụtarị n'Ụlọakwụkwọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka ndị uweojii na steeti Ogun anwụchiela nne na nna maka ịkpọrọ ndị akpụobi, wee gaa n'ụlọakwụkwọ ebe nwa ha na-agụ, wee tie otu onyenkụzi gwòògwòò maka ịpịa nwa ha nwoke ụtarị n'ụlọakwụkwọ.

Mmadụ abụọ ahụ, bụ Maazị Oyedele Nutai Joseph na nwunye ya bụ Oriakụ Elizabeth Joseph bụ ndị a nwụchikọrọ na nsonso a maka ịwakpò ụlọakwụkwọ ebe ahụ nwa ha na-agụ, bụ ụlọakwụkwọ 'Toyon High School Ere' dị na mpaghara Ado Odo nke okpuruọchịchị ime obodo Ado Odo Ota, ha na ndị akpụobi ha kpọrọ bịa. Nke a bụ maka na onye nkụzi ahụ, bụ Abel Thomas maka na ọ pịara nwa ha nwoke bụ Maazị Joshua Joseph (bụ nwata akwụkwọ nọ n'ogoogo SS3) ụtarị; o wee ga kpọọ ha.

Oge nne na nna ya nụchara ihe nwa ha gwara ha, ha gbarụ̀rụ̀ ihu banyere nke ahụ maka na ha kwuru na ya bụ onyenkụzi enweghịdị ikike ọbụla imetụ nwa ha aka ma ya fọdụzie ịpịa ya ụtarị, bụzị nke mere ha jiri kpọrọ ndị omekoome, bụ ndị akpụobi wee wụ̀cháá n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Mgbe ha ruru n'ụlọakwụkwọ ahụ, ha na ndị akpụobi ahụ jidere ya bụ onyenkụzi, tie ya ihe tinka tiri paanụ, merụsịa ya ahụ, ma kụnye ya ikputu ọnụ. Ha mebikwàrà, ma kụwaa ugègbè otu ụgbọala Toyota Corolla (nwere ákàrà LSD 395 FV) nke otu onyenkụzi ọzọ na-arụkwa n'ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Jolayemi Sunday.

Nke a mezịrị e jiri ga kpee ha n'aka ndị uweojii, e wee gaa nwụchikọọ ha, n'ịgbaso ntụziaka onyeisi ngalaba uweojii na mpaghara Ado Odo, bụ SP Arowojeun Michael, bụ onye nyere ndị ọrụ ya ntụziaka ka ha gaa ebe ahụ ozigbo, jide ha. 

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun, bụ DSP Abimbola Oyeyemi gbàrà akaebe na ihe ahụ mere n'eziokwu. Ha kwukwara na e bùùrù onyenkụzi ahụ e tiri ihe wee gaa ụlọọgwụ maka inye ya ọgwụgwọ.

O kwukwara na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Lanre Bankole enyela ntụziaka ka a chụọ ma nwụchikọọ ndị akpụobi ahụ soro wee jee ọgụ ahụ. O nyekwazịrị ntụziaka ka a kpụpụ ndị ahụ e jidere ụlọikpe ngwangwa, n'egbughị oge, ebe a ga-eji usoro iwu wee nyụọ ha anya, ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484