Gọọmenti Anambra Etoola Etu Ọrụ Mkpocha na Nzacha Si Aga n'Okpoko

Apr 17, 2022 - 18:10
 0
Gọọmenti Anambra Etoola Etu Ọrụ Mkpocha na Nzacha Si Aga n'Okpoko

Izunna Okafor dere akụkọ a

Unyi na atịtị bụ nnukwu ihe icheakamgba nyere gburugburu na ebe obibi mmadụ, n'ihi nsogbu dị icheiche si na ya apụta, ọkachasị nsogbu ajọ ọnọdụ ahụike.

Ọ bụ n'ihi nke a ka ọchịchị steeti Anambra, nke Gọvanọ Chukwuma Soludo nọ n'isi ya jiri kpebie ma bagide na nnukwu ọrụ mkpocha na nzacha gburugburu n'ụfọdụ ebe dị icheiche unyi na atịtị jupụtara na steeti ahụ, ọkachasị na mpaghara Okpoko, bụ ebe o kwere nkwa na ọ ga-abụ ebe mbụ ọchịchị ya ga-amalite ọrụ na steeti ahụ. Ya bụ ọrụ bụkwazị nke a malitere n'ime izuụka abụọ gara aga.

Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti ahụ ekwupụtala afọojuju ya banyere etu ọrụ mkpocha na nzacha ahụ si aga, bụ nke a na-eme n'Okpoko dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru, nà mpaggara ebe ndị ọzọ.

Osote Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyeka Ibezim bụ ya kwupụtara otuto a oge ya na ndị òtù ọrụ ya gara njem ileta ka ọrụ si aga na mpaghara ebe ahụ ụbọchị Tuzdee, bụkwa ebe ọ nọrọ wee gbaa akaebe na a na-enwewaga agamnihu na ya bụ ọrụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Ibezim kọwara na atụmatụ ọrụ ahụ bụ nke dabàrà adaba n'ezi ebumnobi ọchnchn Gọvanọ Chukwuma Soludo ikpochasị ebe ahụ niile sụchiri àsụchi na ebe unyi jupụtàrà na mpaghara ebe dị icheiche kemgbe ọtụtụ ahọ, ya na inwogharị steeti ahụ ka ọ chawapụ.

Ka ọ chọpụtara na e nwere ka ọnọdụ siri dị n'akụkụ ebe ahụ mmiri si ehubànye n'Ohimiri Naịja, o nyere Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ na ndị òtù ọrụ na-ahụ maka mkpocha na nzacha ahụ ntụziaka ka ha mee ihe e kwesiri ime na mpaghara ebe ahụ banyere ya bụ ọnọdụ, iji hụ na mmiri na-agara onwe ya nke ọma etu kwesiri ekwesi, iji wee gbochie ijummiri ịwa n'ebe ahụ.

N'okwu nke ya, otu onye n'ime ndị soro wee gaa njem nleta ahụ ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Ifeanyi Okoma kelekwara ndị na-ahazi ma na-elekọta etu ya bụ ọrụ si aga kemgbe izuụka ole gara aga. O kwupụtazịkwara ezi njikere ọchịchị Soludo dị ime Anambra ka ọ bụrụ ejiamaatụ, dịka o siri kwe nkwa mgbe ọ na-achụ nta nkwàdo.

O kwezịrị nkwa na ụlọọr ya eleba anya na nsogbu ahụ a chọpụtara n'ebe mmiri si abanye n'Ohimiri Naịja, iji mee ihe banyere ya ngwangwa, dịka osote Gọvanọ siri nye ntụziaka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484