N'Anaọcha, E Nyela Mmadụ 11 Ọzụzụ n'Ọrụ Aka, Nye Ha Nkwàdo

Mar 2, 2021 - 07:01
 0
N'Anaọcha, E Nyela Mmadụ 11 Ọzụzụ n'Ọrụ Aka, Nye Ha Nkwàdo
N'Anaọcha, E Nyela Mmadụ 11 Ọzụzụ n'Ọrụ Aka, Nye Ha Nkwàdo


Izunna Okafor dere akụkọ a


Mmadụ iri na otù nọrọ na nsonso a wee nweta ọzụzụ n'ọrụ aka dị iche iche ma nwetekwa nkwàdo n'ụdị dị iche iche iji màlite ihe dị iche iche ha mụrụ n'okpuru ọchịchị Anaocha dị na steeti Anambra.

Atụmatụ inye ọzụzụ na inye nkwàdo ahụ bụ nke e wepụtara site n'aka onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Patrick Onyedum, ma bụrụkwa nke e sitere na ya wee nye ndị ahụ sonyere na ya ọzụzụ na ngalaba ọmụmụ ọrụ aka dị iche iche, nke gụnyere ịkwa akwa, ighe ihe oghighe, ịchọ mma, usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ, ịrụ ọkụ, na ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya na mmemme ịchịkọta ọzụzụ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'isi obodo okpuru ọchịchị Anaọcha, bụ Neni; onyeisioche nchere oge ahụ, bụ Maazị Onyedum kwuru na ebumnobi ọzụzụ ọrụ aka ahụ bụ iji chụọ ụbịam ọsọ ma nye ndị ahụ nkwàdo iji bụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ bèlata ọnọdụ enweghị ọrụ.
O kwuru na ọ bụ site n'ime obodo dị iche iche ka ha siri họpụta ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ, nke gụnyere ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị.

Ọ kọwara na ọ nwetere nkwàdo site na ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù n'okpuru ọchịchị ahụ maka ịkwàdo ndị sitere obodo dị iche iche, ma kpọkuzie ndị ọzọ bụ ndị aka ji àkụ ka ha hụta mkpà ọ dị ịkwàdò ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ na ịkwàdo ndị ọzọ ihe na-esiri ike site n'inyere ha aka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha, maka na ọ na-aka mma ịkụziri mmadụ etu e si akụta azụ karịa inye ya naanị azụ.

O kelekwazịrị Maazị Ken Okafor maka ibutesi akụrụngwa dị iche iche e jiri kwàdo ndị ahụ mụrụ ọrụ aka ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ya na ndị ọzọ tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ọbụladị ka ọ kpọkuru ndị ahụ ka ha jiri ọzụzụ na nkwàdo ahụ e nyere ha nwee bàárá onwe ha úrù.

N'okwu nke ya, otu onye n'ime ndị e ji okwu ya agba ìzù ma bụrụkwa onye butere akụrụngwa na igwè ọrụ ahụ e bunyesiri ndị ahụ e nyere ọzụzụ, bụ Maazị Ken Okafor maka ọmarịcha atụmatụ ahụ owepụtara nàkwà usoro ndị ọzọ o sigoro wèta ezi ọchịchị n'okpuru ọchịchị ahụ site n'ịkwalite ezi ọnọdụ obibindụ ụmụafọ ahụ, ịkwàdo mmadụ ịkwụrụ onwe ya na ịkwàlite ọnọdụ mmepe n'ìzùgbe. 

O mere ka a mara na ọ bụ ihe ndị ahụ kpàlirir ya o jiri butesie akụrụngwa na ígwè ọrụ ahụ e bunyesiri ndị ahụ sonyere n'ọzụzụ, dịka otu ụzọ isi tụnye ụtụ nke ya, n'ihi na ekwesighị ka a hapụrụ naanị gọọmenti ọrụ ahụ, maka na ọ bụ site n'ijikọ aka ọnụ ka a pụrụ isi nwete mmeri n'agha ahụ a na-ebu megide ụbịam nà enweghị ọrụ.

Onyeisioche obodo Ichida, bụ Maazị Coleman Ubah na onyeisi ụmụnwaanyị n'obodo ahụ, bụ Oriakụ Appolonia Osigwe kelere onyeisioche okpuru ọchịchị ahụ na ndị ọzọ nyere aka ịhụ na ọzụzụ ahụ gara nke ọma, ma nye ndị ritere urù n'atụmatụ ahụ ndụmọdụ ka ha were ihe ahụ gbasiere onwe ha mbọ ike ma bụrụkwa ndị na-ekewàpụta ohere ọrụ ma na-ewèkwazị ndị mmadụ n'ọrụ n'ime oge adịghị anya, maka na o kwesiri onye a gọziri nọkwata, ọ gọzie ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị ahụ soro rite uru n'ọzụzụ ahụ, nke gụnyere Maazị Chukwuma Nwalie na Oriakụ Ebele Ezeokonkwo kelere ndị haziri ọzụzụ ahụ, ma kwe nkwà itinye ihe dị ivhe iche ha mụtara n'ọrụ, ma jirikwa ya baara onwe ha, ezinụlọ ha na obodo ha úrù n'oge adịghị anya, site n'inye aka nke Chineke.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484