Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Ndị Ohi Iri Na Isii, Ndị Wayo Abụọ

Jan 20, 2021 - 16:20
Jan 21, 2021 - 18:20
 0
Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Ndị Ohi Iri Na Isii, Ndị Wayo Abụọ

By Izunna Okafor

Ndị uweojii steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụ iri na isii a na-enyo enyo na ha bụ ndị adịgboroja na-ana ụtụ n'ụzọ iwu akwadòghị, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ na-anapụsị ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ wee kpata.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Haruna Mohammed kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a.

Dịka o siri kọwaa n'ozi ahụ, ndị ahụ bụ ndị e jidere na mpaghara ebe dị iche iche n'Ọnịsha, nke gụnyere mpaghara isi àkwà mmiri Niger, mpaghara 'Upper Iweka', mpaghara 'Owerri Road' na mpaghara ebe ndị ọzọ, site n'aka ndị uweojii ahụ, nke ọ bụ ACP John Ogbuagbaka duru ha wee gaa.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ ụbọchị Mọnde ka a nwụchikọrọ ndị ahụ, ma mee ka a mara na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma e mechaa nnyocha banyere ihe ahụ ha mere, ebe a ga-anọzị wee nye ha ọnọdụ ruru ha, dịka ihe ha mere siri dị.

N'okwu ya banyere nke ahụ onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP John Abang kọwàrà na njide ahụ e jidere ndị ahụ dịka nke dabàrà adabà n'ịgbasò ntụziaka gọọmenti steeti Anambra na iwu ya megide ịna ụtụ n'ụzọ iwu akwadòghị na ịpụnara ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha ego site n'aka ndị omekoomè, bụ ndị na-ebugharị onwe ha n'ụdị na ha bụ ndị ọna ụtụ gọọmenti steeti ahụ.

O kwukwara na mnwụchi ahụ a nwụchiri ha bụ ndị wàyo dabàkwàrà adabà n'ọmarịcha atụmatụ ahụ gọọmentị steeti ahụ, ndị ọrụ uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ji n'aka, ịchụ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ erughịala na steeti ahụ. 

Dịka ọ na-akọwa na ndị ahụ e jidere ga-ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme, CP Abang dọkwazịrị aka na ntị ka ndị ọzọ na-eme ihe dị etu ahụ sepù aka na ya, n'ihi na onye ọbụla e jidere ga-enweta ntaramahụhụ dị ukwuu, dịka ihe o mere siri dị, nà ụgwọ ọrụ so ya, dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, ndị uweojii Anambra jidèkwàrà ma kpụgharịa mmadụ abụọ na-egwu ndị mmadụ wàyó n'Ọnịsha.

Mmadụ abụọ ahụ, nke gụnyere Dọkịta Ifeanyi Mmadu (gbara ahọ iri ise na anọ) na Maazị Linus Onyekwere (gbara ahọ iri isii na asatọ) bụ ndị steeti Imo ma biri n'Anambra, ma bụrụ ndị e kwuru na ha ji aha ụlọọrụ adịgboroja abụọ wee na-egwù ndị mmadụ ojoro, ma na-anapụsịkwa ha ego ha tara ahụhụ kpata.

Akụkọ kọrọ na mmadụ abụọ ahụ na-agwa ndị mmadụ na ha nwere ụlọọrụ nnọrọonwe abụọ a kpọrọ 'Common Wealth of Nationsn' na 'World Wide Organization', nke bụgbàdò ụlọọrụ adịgboroja, ma bụrụkwa nke ha sitere na ya wee na-aghọgbu ndị mmadụ aka ha dị ọcha, ma na-amịkọsịkwa ha ego site n'ụzọ dị iche iche.

Mmadụ abụọ a, dịka e siri kọọ, nọrọ n'ọnwa Septemba ahọ 2020, wee gwuo ótù nwoke lagoro ezumike nke n'ọrụ, bụ Maazị Emmanuel Nnonyelum ojoro, kapụ ya ego dị otu nde naịra, narị puku naịra anọ na puku naịra isii (N1, 406, 000), site n'ịsa ya isi, tụọrọ ya asị na o nwere ihe ha na-onyeisi ala Nigeria n'oge gara aga, bụ Goodluck Jonathan na-apịkọ, nwoke wee chee na ótù bụ ezie, ha wee si etu ahụ rie ma tichaa ya ozigbo, larié.

Ka ọ dị taa, nnyocha ka na-agakwa n'ihu banyere ihe ahụ ndị ahụ mere, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe ozigbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.