N'Anambra, NSCDC na Red Cross Ejikerela Ịkwàlitè Mgbataọsọ n'Oge Ihe Mberede

Feb 12, 2022 - 22:39
 0
N'Anambra, NSCDC na Red Cross Ejikerela Ịkwàlitè Mgbataọsọ n'Oge Ihe Mberede

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ a maara dịka NSCDC n'aha mkpìrìsì (ngalaba nke steeti Anambra) ekwela nkwà ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọọrụ 'Red Cross Society of Nigeria’ iji kwàlite mgbataọsọ enyemaka n'ebe e nwere ọgbaaghara, ihe mberede maọbụ ụdị ọnọdụ ntụmadị ndị ọzọ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi nà mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ NSCDC n'ime steeti Anambra, bụ DSC Okadigbo Edwin siri kọwaa, ọ bụ onyeisi ụlọọrụ NSCDC na steeti ahụ, bụ Maazị Everestus C. Obiyo, JP+, kwupụtàrà nke a oge ndị sitere ụlọọrụ 'Red Cross Society of Nigeria' (ngalaba steeti Anambra), gara kpọtụrụ ya n'isi ụlọọrụ ya dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Wenezdee.

O chètààrà ha mkpà ọ dị ka ụlọọrụ abụọ ahụ nwee ezi mmekọrịta na njikọaka n'ọrụ, ọkachasị dịka o siri metụta ịgbaje ọsọ enyemaka, ịzọpụta ụmụ mmadụ na iwètà ido n'ebe ọbụla ọgbaaghara maọbụ ihe mberede na ọnọdụ ntụmadị dapụtara n'ime steeti ahụ, n'ihi ọrụ dịịrị ha n'ebe e nwere ụdị ọnọdụ dị etu ahụ.

O mekwàrà ka a mara na e nwèkwàrà ụfọdụ ebe ndị ọzọ ụlọọrụ abụọ ahụ ga na-ejikọ aka ọnụ, ma kwezie nkwà na ụlọọrụ ya na ndị ọrụ ya dị njikere inye aka na inye nkwàdo oge ọbụla a chọrọ enyemaka ha maọbụ arụmọrụ ha, bụ nke dabàrà àdabà n'usoro iwu.

Na mbụ n'okwu ha n'otu n'otu, onye duru ndị ahụ wee bịa ya bụ njem mkpọtụrụ, bụ Maazị Remigius Okafor, na Maazị Fidelis Ikeji kwupụàtà afọojuju ha maka etu onyeisi ụlọọrụ NSCDC na ndị ọrụ siri nabata ha, ma kwupụtakwa obiañụrị ha banyere etu o siri nabata njikọaka n'etiti ụlọọrụ abụọ ahụ.

Ha mere ka a mara na njikọaka ahụ ga-enye aka ime ka a na-enwe mgbataọsọ ngwangwa n'oge nsogbu karịa ka ọ dị na mbụ, nye aka mee ka e nwee ezi nchekwa n'ebe e nwere nsogbu nà n'isi ndị na-agbaje ọsọ enyemaka n'ebe ahụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ njikọaka ahụ ga-ewèta.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484