Obianọ Agbapeela Ụlọ Ikpe Mkpegharị n'Awka

Feb 7, 2020 - 00:26
Jan 24, 2021 - 01:44
 0
Obianọ Agbapeela Ụlọ Ikpe Mkpegharị n'Awka

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụnyaahụ wee gbapee ụlọ ikpe mkpegharị ọhụụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụkwazị ụlọ ikpe mkpegharị mbụ a na-eguzobe na steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ ụlọ ikpe, Gọvanọ Obianọ kọwàrà ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị na steeti ahụ, n'ilegara anya nà mpụtara ya n'ebe o mètụtàrà mgbasàwanye nke ikpe nkwụmọtọ, nnwere onwe na ọchịchị onye kwuo uche ya.
O mèrè ka a mara na ọ bụ naanị ụlọ ikpe mkpegharị iri na isii ka e nwèbụrụ n'ala Nigeria, wee ruo na nso nso a rụnyèkwùrù anọ n'Awka, Asaba, Kano na Gombe n'otu n'otu, nke mezịrị ka ọnụọgụgụ ya dịzie iri abụọ; ọbụnadị dịka ọ gàkwàzịrị n'ihu kọwaa na mgbape ahụ a gbàpèrè nke Awka mèzịrị ka ọ bụrụ ụlọ ikpe mkpegharị nke iri na asatọ n'ala Nigeria, n'ihi na a gbapèbèghị abụọ ndị ọzọ.

Ọ kpọpụtàsịrị ọtụtụ uru dị iche iche ya bụ ụlọ ikpe ga-ewèta, ma kwuo na ọ ga-aga n'ihu ibèlàtàrà ndị Anambra na ndị ọrụ ikpe steeti ahụ ntaramahụhụ ịdị na-aga ụlọ ikpe mkpegharị nke dị n'Enugu ịchọ ikpe nkwụmọtọ, n'ihi na akwụkwọ ndekọta na-akọwa na pasentị iri asaa na ise ikpe mkpegharị a na-ekpe n'ụlọ ikpe mkpegharị Enugu ahụ bụ n'Anambra ka ha si abịa.

Gọvanọ Obianọ sị na ọchịchị ya akwụchàpụla ụgwọ dị ichè ichè ọchịchị nọbụrụ na steeti ahụ n'oge mbụ jìkọbàrà ndị ọrụ ikpe, rụọrọ ha ezigbo ebe obibi, ma kwezie nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàdò ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, ya na ịkwàlite ezi mmekọrịta n'etiti alaka gọọmenti atọ nke steeti ahụ, iji mee ka ọnọdụ kawanyere ụmụafọ steeti ahụ mma.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlọ ikpe mkpegharị n'ala anyị, bụ ọka ikpe Zainab Bulkachiwa (bụ onye ọ bụ ya na Gọvanọ Obianọ jikọrọ aka wee gbapee bụ agadaga ụlọ); Ọkaikpe Nkwụmọtọ steeti ahụ, bụ Manasseh Anyachebelu; ndị omebe iwu steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ.

Ọ dị nchèta na ọ bụ n'ahọ 2018 ka Gọvanọ Obianọ gùzòbèrè òtù ọrụ mmadụ ise, nke ọ bụ Dọkịta Onyechi Ikpazụ nọ n'isi ya, maka igùzòbè ụlọ ikpe mkpegharị na steeti ahụ, nke ahụ wee bụrụzie nke a rụchara ma gbapee ka ọ gàchàrà ihe erughị ahọ abụọ, bụ n'ahọ 2020.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.