Ụmụ Nwaanyị Ọrụ Ugbo Anambra Arịọla Ngwaọrụ Ga-enyere Ha Aka

Nov 29, 2019 - 20:19
Jan 24, 2021 - 03:54
 0
Ụmụ Nwaanyị Ọrụ Ugbo Anambra Arịọla Ngwaọrụ Ga-enyere Ha Aka

Ibe Kelechukwu, Ogun

Opekampe ụmụ nwaanyị ọrụ ugbo dị narị isii, nọrọ ụbọchị Tọzdee kpọọ ganigani na steeti Anambra dịka ha na-arịọ ka enye ha ngwaọrụ ga-enyere ha aka. Ụmụ nwaanyị ahụ kwuru na anaghị etinye ha dịka a na-arụpụta ngwaọrụ ọrụ ugbo.

Dịka ha gbakọtara site na okpuru ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu dị na steeti ahụ, ụmụ nwaanyị ahụ kwuru na ha na-anọchite ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ruru puku iri, narị abụọ na iri ise na atọ na-akọ ihe n'ike obodo na steeti ahụ. Onye nchịkọta otu ahụ na Naijiria, Omaboyowa Roberts, kwuru na ịkpọ ganigani ahụ bụ ka ha were kpọta uche gọọmenti n'ebe mkpa ha dị bụ ndị ka n'ọnụ ọgụgụ ndị na-akọ ihe na steeti ahụ.

O kwuru, "Anyị chọrọ ime ka gọọmenti mara na ihe karịrị pacenti iri asaa ndị ọrụ ugbo bụ ụmụ nwaanyị bụ ndị nọ n'isi ịkọpụta nri. Ọ dị mkpa ka ebilite ego amụma ọrụ nke a na-etinye n'ọrụ ugbo ka steeti ahụ were gboo mkpa ụmụ nwaanyị ahụ. Kamgbe afọ gara aga, anyị bidoro ijide gọọmenti maka ị kwado ụmụ nwaanyị ndị a na-akọpụta nri."

O kwuru, "Anyị na-arịọkwa ka ngwaọrụ ndị ụmụ nwaanyị ga-ejinwu were kọọ ọrụ bụrụ nke arụpụtara, dịka ìgwè na-akọrị ala na nke na-akụ ihe ka o were nyere anyị aka n'ịkọpụta ma wulite ezinaụlọ anyị na obodo." O kwuru na ozi a bụ nke aga ezi na ala Naịjiria gbaa gburugburu ga-adị na steeti ise nke gụnyere Nasarawa, Niger, Jigawa, Anambra na Oyo, bụ nke a ga-achịkọta na Abuja ebe ha ga-enye gọọmenti nchịkọta ihe niile.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.