Nri

Sep 2, 2017 - 19:49
Jan 21, 2021 - 21:20
 0
Nri

Izunna Okafor, Awka

Nri bụ nwata hụ ọ gbakee, ma bụrụkwa okpo hụ ọ jụrụ. Ọ bụ erighị ma sịṅebuna, n'ebe mmadụ na ihe ọbụla na-eku ume dị.

Ndị kwuru okwu sị na nri bụ ihe si n'elu baa ma si n'okpuru pụọ, n'ihi na erighṅ na anyụghị bụ ebụghị ebu.

Dịka ọ bụ ọdibendi, ọ bụ ihe a ma ama, na mba ọbụla nwere ihe e jiri mara ha maka na ụtọ bụ ihe onye kpọrọ ụtọ. Ọ bụkwa na ihe ndị na-eri ka ndị na-asọ.

Ndị Igbo, ndị Yoruba na Awụsa nwagbdoro nri dị iche iche e jiri mara ha. A bịakwa n'ala Igbo, ndị obodo dị iche iche nwere ihe ha na-eri na nke ha na-asọ. Ihe ọbụla ndị na-asọ nwekwara ụfọdụ ihe kpatara ha ji asọ ya, ọ kachasị n'ebe anụ a na-eri eri dị.

Iji ma atụ, Ọka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa otu n'ime obodo dị n'ala Igbo, anaghị eri anụ enwe n'ihi na ha kwenyere na ọ bụ enwe bụ mmụọ nwe ha.

Ọzọkwa, ndi Ebenator, dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' na steeti Anambra anaghị eri anụ eke, n'ihi na ha kwenyere na ọ bụ Eke Ọfala, bụ mmiri dị n'obodo ahụ nakwa arụsị ha fere oge gboo.

Ọ bụ ihe doro anya na asụsụ dị iche iche, mana a kwaa ụkwara, ọ bụrụ otu. N'ihi nke a, e nwere ụfọdụ nri dị iche iche zuru ụwa ọnụ, bụ nri a na-eri ebe ọbụla, dịka osikapa, agwa na ndị otu ha.

N'ala Igbo, e nwere nri dị iche iche e ji mara ha, bụ nke ha kwenyere na-enye ha ihe n'ahụ karịa ihe ndị a na-emepụtazị n'oge ugbu a, sị na ọ bụ nri. Ọ bụ nri ndị a mere ndi nna nna anyị ha jiri bie ogologo ndụ ma na-emesikwa ihe ike n'oge nke ha, bụ oge gboo.

N'oge gboo ahụ, nri dịka ede, akpụ, ji, adụ, ọnà, ụtara ji, ụtara ede, nduku, ụgbọgụrụ/anyụ, ighu, ịbaa, mkpụrụ ụgụ, ụkwa, ọka a gwọrọ agwọ, abacha, ọgbara, ụgba, ojoko, akịdị, fịọfịọ na nri ọdịnala ndị ọzọ bụgbado nri oke ụtọ; ebe akwụkwọ ọkazị, ụtazị, ụzịza, nchụ anwụ, ụkpaka, ose, ụrị (ede ụrị), ogiri, azụ kpọnkụ, okporoko, ịsha, oguru akwụ, mmanụ nri, akwụkwọ nri dị iche iche nakwa ngwa ofe ndị ọzọ bụ ahụghị ebuli ma sị eline dika, n'ebe isi ihe oriri dị, n'ala Igbo.

Oge ahụ bụ oge ndị ghọtara ihe nri bụ ji aka ha aba n'ụsọ ekwu ma sie bupụtara ohà, maka na ha ghọtara nke ọma na nri anyị bụ ọgwụ anyị. Ọ bụ nnọọ oge a na-esighe nri esighe. Ihe ndị a mere ndị gboo ahụ jiri wee nọọ ahọ kwuru ahọ ma na-atụkwa gengem ka ihe a fụrụ afụ. Ọ bụ n'oge ahụ ka mmadụ ga-anọ ihe karịrị narị otu ahọ ma na-agbakwaara onwe ya ọsọ ka nwa okorobịa na-ejighị nkpọ, na-arịaghịkwa ọrịa ọbụla ma ọ bụ yiri ugegbe anya.

Eziokwu na-elu ilu na ntị ugbu a bụzị na ihe ndị a abụrụla mba a gara aga, maka na okokporo nwoke amaghịzị uru ara baara ikwe.

Ndi Igbo, ugbu a, amaghịzịkwa ihe a na-akọ banyere nri ọdịnala e jiri mara ha, ma ya fọdụzie ịma otu e si esi ma ọ bụ akwado ya. Nke ahụ wee bụrụ otu n'ime omenala anyị na-anwụnahị anyị ugbu a.

Ugbu a bụzịkwa oge nwa agbọghọ amaghị nke ekwe na-aka, ga-abaa ụsọ ekwu, sie ihe egheghị eghe bupụta ma kpọọ ya 'haff dọn'. Nke ahụ wee bụrụ asụsụ pụtara ọhụụ ha ji aghọgbu onwe ha na ndị ha na ha bi n'ụlọ.

Ndị okokporo ume ngwụ na ụmụ agbọghọ oji ọnụ etinye azụ n'ofe jizịkwa ya bụ asụsụ amaghị ebe o si wee na-atọgha ndị ọ dị nke mma, ka ha wee sonye na ya bụ ụzọ ọgbara ọhụụ, bụ nke ha sịzịkwa na ọ bụ otu ndị ọcha si esi nke ha. Ha bụ ụkpana na-ere ọkụ wee chee na ha na-aha mmanụ.

Ọzọkwa, e wezuga isi na iri nri egheghị eghe, ndị Igbo esina n'iri nri chi ha jiri gọzie wee pụọ, sị na ọ bụzịkwa iri ihe ha amaghị ebe o si na otu e siri mee ya kazị ha mma.

Nke kacha agba ha ara ma bụrụkwa nke na-ata ha ego gwoo gwoo bụ nke ahụ pụtara ọhụụ na-adị ka idide ma ọ bụ eriri afọ nwa ọkụkọ, nke a sị ha kpọba indomì. Ha wee werezie ya mere nri kacha ụtọ na nke na-eghe ịchafụ ịchafụ.

Ugbu a bụ oge ị ga-ahụzị nwa agbọghọ ma ọ bụ okorobịa ahụ zuru oke, kwa ụbọchị, o rie ya bụ indomì n'ụtụtụ, ñụọ mmanya fanta, rie ya n'ehihe ñụọ fanta, rikwazie ya n'abalị ma werekwa otu fanta ahụ budaa ya, huo aka n'afọ ma bie ezigbo ubiri dara ụda. Ị kpazịe ya aka, ọ wụọ efe ka ọkụkọ na-efe elu. Obere oge ọ malite ịdọnye afọ ka onye otoro na-awa. Tupu ị mara ihe na-eme, a sị na ọ na-arịa kansa, ma ọ bụ arịrị ọzọ adịghị n'asụsụ Igbo. Nke ahụ wee bụrụ ihe na-egbusi ndị be anyị.

Oge agaana mgbe a na-eji akwụ, ogiri, ụzịza, ọkazị, ịsha, nchụ anwụ ma ọ bụ ụtazị were ete ofe. Ụtara ede, ụtara ji, ụtara akpụ, ikpoko akpụ, adụ, ighu na ọna abụrụgokwa ihe mgbe ochie ma na-asọzịkwa ndị Igbo oyi oriri.

Ọ bụzịkwa Maggị, Ọnga, ofe e ghere eghe, Gesha, Spagetti, Nọtmeegị, Tomato na ndị otu ha ndị ọzọ kachazị anyị mma. Onye ghekọchazie ihe ndi ahụ rie, ọ chọọ otu mmanya akwụkwọ ma ọ bụ mmanya ekpem jụrụ nwịị wee butuo ya. Mmadụ a na-agbada. Obere oge otu ọrịa ejide ya.

Okorobịa dị n'agbata ahọ iri anọ na-ejizịkwa nkpọ na ugegbe anya aga ugbu a n'ihi na mmadụ ejighịzị ahụ. Tupuu ahọ iri na isii, onye ahụ nwụọ, a sị na ọ nọka, ma ọ bụ na o biri nnọọ ogologo ndụ.

Nke a wee bụrụ maka ihi na anyị elegharana ịsụ n'ikwe wee na-asụzị n'ala. Onye ọbụla wee na-arịazị ihe anyị amaghị ma na-anwụchuzị anwụchu ka ọkụkọ. Ndị be anyị, ka anyị ghọtanụ na nri anyị bụ ọgwụ anyị, na ọ bụkwa ihe onye kpọrọ nwa nkịnta ya ka ọ na-aza, maka na ike anaghị anyụ ihe ọnụ erighị. Onye hụrụ na ihe gburu nne ya bụ eju, ihe gburu nna ya bụrụ eju, ma ya onwe ya kachie kwa ntị jidekwa eju n'aka, ọ makwa na ọ bụ ọnwụ nke ya ka ọ na-akpọ oku??

Ya mere, ka anyị laghachinụ azụ na nri e jiri mara ayị, bụ nke ndị nna nna anyị ha riri wee bie ogologo ndụ. Ka anyị sepụlata aka n'ụmụ nrị ọgbara ọhụụ ndị aṅna-agbakọ na mkpọ, bụ nke anyị na-amaghị ebe, otu na ihe e jiri mee ma bụ gbakọọ ha; ka ndụ anyị wee dịrị anyị ogologo.

Nwata a na-akpọ oku, ọ na-agbakpu ọhịa ga-emechakwanụ mara na ọhịa abụghị ebe obibi.

Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya.

Ụkpana okpoko gburu bụ ntị chiri ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.