Onye Omeiwu Anambra, Okafor Arụgharịarala Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ya Gbara Ọkụ Na Nnewi

Sep 30, 2020 - 00:02
Jan 25, 2021 - 00:03
 0
Onye Omeiwu Anambra, Okafor Arụgharịarala Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ya Gbara Ọkụ Na Nnewi

...Nyékwá Ya Ego Ọ Ga-Eji Bido Ahịa
Izunna Okafor dere akụkọ a

Omere nwaogbenye na-emere Chi kere ya, maka na ọrụ ọbụla wèrè ụgwọ.

Ọ bụ n'ịgbasò nke a ka onye omeiwu ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi North' n'ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Nonso Okafor jiri rụzigharịa ma dozigharịara otu nwaanyị ajadụ ụlọ ya dakpọsịrị adàkpọdị n'Umuzu Mbana, Otolo Nnewi. Ya bụ ụlọ nwéré ime ụlọ anọ a rụzigharịrị ọhụụ bụ nke a gbàpèrè, nyefèé ya n'aka nwaanyị àjàdụ ahụ na nsonso a; ma bụrụkwa nke a gbapegidere ya na ụlọ mposi na ogige ebe a na-asa ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ụlọ ahụ, onye omeiwu ahụ, bụ Maazị Okafor kọwàrà nke ahụ dịka otu n'ime ụzọ o si eme ka ihu ọchị waa ndị ọ na-anọchite anya ha n'ụlụ omeiwu steeti ahụ, na-eme ka ọnọdụ dịrị ha mma, ma na-ewètekwara ha èrèrè ọchịchị onye kwuo uche ya.

O mere ka a mara na ọ nọrọ n'abalị iteghete nke ọnwa Julaị ahọ a wee nweta ozi na ụlọ ótù nwaanyị ajadụ, bụ Oriakụ Eberechukwu Igwilo na-agba ọkụ n'Umuzu Mbana dị n'Otolo Nnewi. O kwuru ọ bụ ezie na ndị àgbataobi nwaanyị ajadụ ahụ nyèèrè ya aka menyụọ ọkụ ahụ n'ikpeazụ, mana ya bụ ọkụ gbapịàrà akụkụ ụfọdụ n'ụlọ ahụ, ma gbarikọkwa ọtụtụ ihe ebe ahụ, nke mezịrị na imirikiti ihe nwaanyị ahụ na ụmụ ya ise jiri biri gbàrà ọkụ.

O kwuru na oge ọ garuru na be nwaanyị ajadụ ahụ, wee jiri anya ya hụ ihe mere, nakwa etu akụkụ ụlọ ahụ dị iche iche siri kaa nka ma dàkpọsịkwa adakpọsị, na o metụrụ ya n'obi, bụ ihe nwaanyị ahụ na ụmụ ya na-agabiga. Nke a, dịka o siri kwuo, mere o jiri kpebie ma bàgide n'ọrụ idozigharị na inwòghàrị ụlọ ahụ ka ọ kwụrụkwa ọzọ. O kwuru na ọ malitere ịrụgharị ya bụ ụlọ n'ọnwa Ọgọstụ; o wee rụchaa ya ma tinyesie ya akụrụngwa dị iche iche e ji enyere ndụ aka na ihe e ji akwàlite ọnọdụ obibi ndụ, bụzị nke o nyefèzịrị n'aka nwaanyị ahụ ụbọchị ahụ.

Maazị Okafor nọkwazịrị ụbọchị ahụ ọ gbapere ụlọ ahụ wee nye nwaanyị ahụ akwụkwọ ndọrọ ego dị otu narị puku naịra (N100, 000) ka o were màlite ịzụ ahịa ma sikwa ebe ahụ na-enweta ego ọ ga-eji na-elekọta ụmụ ya anya ma na-akwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ.

O kwèrè nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịnọchite anya ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ nke ọma ma na-emekwa ka ihu ọchị waa ha oge niile, n'ihi na nke ahụ so na nkwà o kwèrè ha oge ọ na-achụ nta nkwado.

Na nzaghachi ya, nwaanyị ajadụ ahụ, bụ Oriakụ Eberechukwu Igwilo, onye ọñụ jupụtara n'obi, kèlèrè Maazị Okafor ma kpọọ isi ala nye Chineke onye jiri ya wee kwara ngwaọrụ site n'iji ya tutekwa olileanya ya ma mee ka ihu ọchị waa ya na ụmụ ya ọzọ.

Ya bụ nwaanyị àjàdụ, onye di ya nwụrụ n'ahọ 2011, kọrọ etu ọnọdụ siri dịrị ya n'oge mbụ ụlọ ha ahụ dakpọsịrị. Ọ kọwàrà onye omeiwu ahụ dịka nwoke obi umeala, ma kpekwazie ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya na ịkwụghachi ya mmaji kwuru mmaji.

Ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu na ndị sitere ọgbọ nta nkwàdo ahụ sonyèrè na mmemme ịgbape na inyefè ụlọ ahụ, ma bụrụkwa mmemme a nọrọ na ya gọzie ma kpeere onye omeiwu ahụ usoro ekpere dị iche iche maka ezi ọrụ ya.

Ọ dị ncheta na Maazị Okafor nọbụrụ n'ime ọnwa olenaole gara aga wee rụọrọ ụmụnwaanyị ajadụ atọ amụtaghị nwa ọmarịcha ụlọ ọhụụ na Nnewi, ma rụkwa ebe a na-ega mposi n'ahịa Eke Amangwu, dị  n'Ụmụdim Nnewi, tinyere ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ọ rụgoro n'ihe erubeghị ahọ abụọ o jiri bànye n'ọkwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.