Ịlụ Nwaanyị

Sep 11, 2017 - 09:51
Jan 22, 2021 - 04:22
 0
Ịlụ Nwaanyị

Izunna Okafor, Awka

Ịlụ nwaanyị bụ ọzọ dịịrị okokporo niile, ma bụrụkwa a na-agụrụ akwụ nwanne ya a na-eghe. Ọ bụ ụkwa ruo oge ya, ọ daa. Ịlụ nwaanyị bụ okokporo rie ọ lakpuo n'ihi na ọ bụ òke ọhà, onye kere nke ya, ọ lakpuo be ya, ga ribe. N'ihi na a sị na ihe mmadụ ruru ogo ya wee rie, ọ bụghị akpịrị, ịlụ nwaanyị bụ omenala zuru ụwa ọnụ. Ya bụ, ndị mba ọbụla n'ụwa gbaa gburu gburu na-eme emume ịlụ nwaanyị n'ihi na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mee anụ, ọkọchị na udu mmiri. Ya mere okokporo ọbụla ji agbakarị ala ka ọ kpọta nke ya, maka na a sị na onye lee ihe ibe ya mere, o nwee ọnụ okwu n'ebe ibe ya nọ.

Ịlụ nwaanyị bụ ọzọ dịịrị okokporo niile, ma bụrụkwa a na-agụrụ akwụ nwanne ya a na-eghe.

Ọ bụ ụkwa ruo oge ya, ọ daa. Ịlụ nwaanyị bụ okokporo rie ọ lakpuo n'ihi na ọ bụ òke ọhà, onye kere nke ya, ọ lakpuo be ya, ga ribe.

N'ihi na a sị na ihe mmadụ ruru ogo ya wee rie, ọ bụghị akpịrị, ịlụ nwaanyị bụ omenala zuru ụwa ọnụ. Ya bụ, ndị mba ọbụla n'ụwa gbaa gburu gburu na-eme emume ịlụ nwaanyị n'ihi na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mee anụ, ọkọchị na udu mmiri. Ya mere okokporo ọbụla ji agbakarị ala ka ọ kpọta nke ya, maka na a sị na onye lee ihe ibe ya mere, o nwee ọnụ okwu n'ebe ibe ya nọ.

Ịlụ nwaanyị so n'otu n'ime njirimara ndi Igbo, ma n'oge gboo ma n'oge ugbu a. Ọbụnadị akwụkwọ nsọ kwadoro ya, nke pụtara na Chineke onwe ya ghọtara ihe nwoke na-agabiga, ma marakwa ebe o ji nwamkpi; o wee sị na ọ dịghị mma ka ọ nọrọ naanị ya. Ndị kwuru okwu sị na ahụ abụghị ogwodo nkụ.

Ịlụ nwaanyị nwere usoro n'ala Igbo, ma bụrụkwa nke uche dị n'ime ya, n'ihi na ọ bụghị ebe ọbụla onye siri pụta, ọ ga maburu nwaanyị.

N'ala Igbo n'oge gboo, ịlụ nwaanyị na-abụ nnọọ nke a kwadobere nke ọma, ma bụrụkwa nke a na-ehi asaa naabụ n'anya were eme, n'ihi na onye banye, ọ banyesịgokwa. Nke ahụ bụ maka na ndi gboo ahụ ghọtara na alụm di na nwunye abụghị egwu apa ụtaba n'aka agba. Ọ bụghịkwa 'suru ụtara ka m nuru ofe m'. Ọ bụ ya mere na n'oge ahụ a dịghị enwekebe oke ọgu na mgba, esemokwu, alụkata esee nakwa ọtụtụ nsogbu dị iche iche ndị ugbu a na-enwe n'ebe ịlụ di na nwunye dị.

Mgbe ahụ, nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị nwegasịrị ụfọdụ ihe ọ ga-eme tupuu ọ kpọrọ ya bụ ogoli nwaanyị labaa. Mana ugbu a, ihe ndị ahụ adagharịana n'ihi na ụmụ okorobịa ọgbara ọhụụ a na-atazị na-achaghị acha ma na-erizịkwa na-egheghị eghe.

Nwaokorobịa ọbụla chọrọ ịlụ nwaanyị n'oge ahụ ga-ebugodi ụzọ tuzuo oke n'ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa onye anọghị nkịtị, ka agụụ wee ghara igbu nwaanyị ọhụụ ahụ maka na ọ bịara ije di. A sịkwaṅna onye rie ede na-egheghị eghe, ọ gbaa ya na-ebeghị ebe.

Nwata nwoke ahụ, mgbe ọ hụrụ nwa agbọghọ chara acha ọ chọrọ ịlụ, ọ gaghị agwagodi ya ihe ọbụla, kama ọ ga-ebu ụzọ na-enyocha ma na-amụ ya ka akwụkwọ. Ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ dị nnọọ mma idebe n'ụlọ, ọ ga-aga gwatụrụ nne na nna nke ya banyere ya bụ ụtụ chara acha ọ hụrụ n'ụzọ, ma kọwatakwara ha onye ọ bụ.

Oge ahụ, nne na nna ya ga amalite inyocha na ịjụ ase banyere ya bụ nwata nwaanyị na ndị ezinaụlọ ha, ịmara otu ha si eme, ịmara ndị si na ezinaụlọ ahụ pụta  ọ na-ezu ohi, ma ha ọ na-agba ara, ma ha ọ na-akwụ ụdọ ma ọ bụ ma ọ bụ ma o nwere onye si n'ebe ahụ kwụgoro ụdọ n'oge gara aga; ma ha ọ na-amụnwukwa nwa, ọ kachasị nwa nwoke, ma ndi be ha ọ na-akpa nsi ma ọ bụ na-ata amoosu,  ma o nwere ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche ejiri mara ha, ọbụnadị ruo n'okwuru anọ gara aga (past four generations).

Nke kachasị nke bụ na ha ga-enyochaa ma jụọ ase miri emi, iji mara na onye si n'ezinaụlọ ha ọ pụkwara ịlụ onye si n'ezinaụlọ nke nwaanyị, ka o nwere ihe jikọrọ ha ọnụ dịka otu ọbara. Nke a bụ ka e wee gbochie nsogbu ụdị ọbụla ịdapụtara n'ọdịnihu maka na ọbara  esika. Ọ bụkwa ajụghị ajụ e rie na-ebute arịaghị arịa a nwụọ.

Mgbe ha gadụchaara ihe ndị a ma mechaa nnyocha niile ahụ wee hụ na ụzọ gara, ha ga-ejikere buru ihe dịka otu ite nkwụ wee gaa be ndị nke nwaanyị iji mee ka ha mara na o nwere akwụ chara acha ebe ahụ ha chọrọ ịkpara. Nke ahụ ka a kpọrọ ije 'amara m ụzọ ọgọ' ma ọ bụ 'ịkụ aka n'ụzọ' (dịka ndị si akpọ ya).

Nke ahụ pụtara na ha bịara ịkụ aka n'ụzọ ọgọ iji mara ma a ga-emeghekwara ha; na ụzọ ọ gakwara.

N'aka nke ha, ndị be nke nwaayị nabatachaa ha na ije ha bịara, ha ga-emekwa otu ụdị nnyocha ahụ ndị be nke nwoke mere ma jụkwa ase niile ahụ ha jụrụ banyere ha n'ihi na a sị na ozu nwaada adaghị n'isi nna ọ daa n'isi ọkpara.

Ọ bụrụ na ha mechaa ihe ndị ahụ wee chọpụta na ọ ga-adaba, ha ga-eme ka nwa ha nwaanyị mara otu ihe siri gbata kwụrụ, iji wee mara ọnụ mmiri okwu ya banyere nke ahụ, maka na ọ bụ ya bụ ọnụ na-elo ụtara ma ụdị okpoko ọ chọrọ.

Na ngwụcha ihe niile, ọ bụrụ na nke nwaayị kweta, ọ ga-aga ilele ala na be nke nwoke iji mara ka ọnọdụ siri gbatakwụrụ n'ezinaụlọ ya. Nke ahụ bụkwa oge ya na nke nwoke ga-eji wee mụọ onwe ha iji mara ma ọ ga-adabakwa, na o rekwara ka a gọrọ. Ya na nke nwoke agaghịkwa abakwuru onwe ha chaa chaa, ma ya fọdụzie ije n'ọnwa.

N'ikpe azụ, ụbọchị ọ ga-ala, ọ ga-ebu ite mmanya n'isi wee ga kọọrọ ndi be ya ihe ọ hụrụ banyere ya bụ ezinaụlọ, wee gwa ha ma ọ ga-adaba ma ọ bụ na ọ gaghị adaba. Ọ bụrụ na nke nwaanyị ekweta, a ga-ezighachizịrị ndị be nke nwoke ozi ka ha bịa, e wee kanyezie ụbọchị a ga-abịa ime ego (ma ọ bụ ya na ịgba nkwụ). E wee zibezịe ndị ikwu na ibe.

Ọ bụzị mgbe e mekọrọchaara ihe ndị a ka nke nwaanyị ga akwakọrọzị ngwongwo ya lakuru nke nwoke n'ihi na o nyego ndị be ya ihe ha na-eri, nke gosiri na o chizuona ma tozukwa oke ịkpọrọ ya na nwunye. Nke ahụ wee bụrụ otu ndi Igbo si eme ya n'oge ahụ.

Mana ugbu a, ihe adagharịsịgo n'ihi na ụmụ ntorobịa anyị na-atazịkwa na-achaghị acha, ma na-erizịkwa na-ajụghị ase. Ugbu a, ọ kachasị nke nwoke na-achọzịkwa ka o buru ụzọ detụ ihe ire, rie ihe nne ya riwọrọ ya ma ọ bụ bịnyegodi nke nwaanyị ogbe afọ tupuu a mara na a ga-alụ ma ọ bụ na a gaghị alụ.

Ọ bụzịkwa ebe onye siri kote nwaanyị, o koro ya lakpute sị na ọ na-alụ ya alụ, ebe ụfọdụ na-anọ ebe ha hụrụ nwata nwaanyị anya mbụ gbado ya ma kweya nkwa ọlụlụ ozigbo ozịgbo; nke nwaanyị ekwetekwa zigbo ozịgbo ahụ na-egbughị oge, na na-ajughịkwa ase.

Onweghizịkwa ihe dịka ilele ala, ma ọ bụ inyocha mara ka ezinaụlọ ndị ahụ dị maka na ọ na-eghuzị ụmụ okoro na ụmụ agbọghọbịa ugbu a eghu,  ọ kachasị ọ bụrụ ebe ego dị. Ha wee chezọọ uru ara baara ikwe maka na ọ na-adịzị onye ọbụla n'ọkụ n'ọkụ, nke mezịrị na ọtụtụ adanyena n'ọtụtụ ihe ọjọ dị iche iche, na ọtụtụ ezinaụlọ aghasaana, ebe ọtụtụ bụzịkwa a lụọ ta, a laa echi maka na ha bụ ọkụkọ ajụwughị ajụwu tupuu ribe. Ụfọdụ esikwana n'ụzọ dị otu ahụ dinaa ma ọ bụ lụọ otu ọbara ha na-maghị ama; nke bụ nnukwu arụ kwọ nwa n'ala Igbo, ma sokwa n'ihe ji ọtụtụ ezinaụlọ agaghị n'ihu ma ọ bụ amụtaaghị nwa, ma ọ bụ nwa nwoke, ruo n'ụbọchị taa. Ọtụtụ atụfugokwa ndụ ha n'ihi ajọ nwoke ma ọ bụ ajọ nwaanyị ha lụtara maka na ha ajụghị ase.

E nwekwara ọtụtụ ihe egwu na ajọ ọnọdụ ndị ọzọ dị iche iche na-esikwa n'ihe ndị ahụ apụta.

Ndị be anyị, na nchịkọta, mmechakọrọ ihe ndị a niile bụ ka anyị laghachinụ azụ n'ụzọ na usoro ahụ uche dị n'ime ya, bụ otu e si alụ nwaanyị n'ala Igbo n'oge gboo, ka anyị wee gbanahị ọdachi, nsogbu na ihe egwu ndị ọzọ niile na-si ime  ya apụta, bụ nke jupụtakwara n'ọtụtụ ezinaụlọ taa; ka udo wee dịrị anyị.

Nke a ga-emekwa ka anyị nọọ ogologo ndụ ruo ahọ ole Chineke debeere anyị, maka na mmadụ ịlụta ajọ nwaanyị ma ọ bụ ajọ nwoke na-eweta ọnwụ erughị eru maka na n'ebe ọkụkọ na-eṅakpa nri ka a na-ebute ozu ya. Ajụghị ajụ e rie bụkwa ya na-ebute arịaghị arịa a nwụ. Ọzọ, nwaanyị bụkwa ahịa akpa, onye enyochaghị enyocha wee goro laa, ihe ọ tọghetere, ya na chi ya.

Ya bụ, ka anyị hie asaa n'anya, maka na onye banye, ọ banyesịgo. A sị na  jụlaruo, a kọwaruo.

Ndeewo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.