Ụlọ Ọba Akụ FCMB Ejirila Akpa Osikapa 850 Kwado Gọọmenti Anambra

May 6, 2020 - 20:47
Jan 22, 2021 - 21:13
 0
Ụlọ Ọba Akụ FCMB Ejirila Akpa Osikapa 850 Kwado Gọọmenti Anambra

Izunna Okafor, Awka

Ụlọ ọba ego 'First City Monumente Bank' (FCMB) nọrọ na nso nso a wee bunye gọọmenti steeti Anambra akpa osikapa ruru narị asatọ na iri ise, iji kwàdo ya n'agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa nje korona nakwa mmetụta nke oge ọrịa ahụ n'ahụ ụmụafọ steeti ahụ.

Ka ọ na-enyefe gọọmenti ego ahụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, onyeisi ngalaba nke abụọ nke ụlọ ọba ego ahụ n'Awka, bụ Maazị Victor Agumadu kọwara nke ahụ dịka ótù n'ime ụzọ ụlọ ọba ego ahụ si atụnye ụtụ nke ya n'ibelàta ihe dị iche iche ụmụ mmadụ na-agabiga n'ime oge a ọrịa korona na-ebi ụwa aka ọjọọ.

O kelere gọọmenti steeti Anambra maka ezi ọnọdụ dị larịị o nyere ụlọ ọba ego ahụ n'ime steeti ahụ, kelekwa ya maka ihe dị iche iche o megoro n'agha ọ na-ebu megide ọrịa korona, ma dụọ ya ka o jisie ike na-eleghị anya n'azụ.

Onye nabatara ihe onyinye ahụ n'aha gọọmenti, ma bụrụkwa ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kelere ya bụ ụlọ ọba ego maka ịza ọkpụkpọ oku ahụ gọọmenti steeti ahụ kpọrọ maka mgbata ọsọ na nkwàdo site n'aka ndị mmadụ, ụlọọrụ nakwa òtù dị iche iche.

O nyekwazịrị òwùwè anya na a ga-etinye ihe ndị ahụ e wèkọtàra n'ọrụ etu o siri kwesi, ma mekwa ka nke e kwesiri ikesà ekesà ruo ndị e mebeere ha aka.

O kwupụtakwara na aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ àkwàdola ma nyekwa ntụziaka ka e kesàá ụfọdụ ihe oriri dị iche iche a tụkọtara nyegara ezinụlọ iri ise ihe kacha esiri ike n'ime steeti ahụ, bụkwa ndị debànyègoro aha n'ụlọọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka, bụ.

O kelekwazịrị ndị zagoro ọkpụkpọ oku gọọmenti steeti ahụ banyere ọrịa ahụ, ma kwàdokwa ya bụ gọọmenti n'ụzọ dị iche iche, iji nweta mmeri n'agha ahụ ọ na-ebu megide ya bụ ọrịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.