Gọọmenti Anambra eguzobela òtù ọrụ pụrụ iche maka nsogbu dị n'etiti Omor na Umumbo

May 20, 2020 - 20:13
Jan 22, 2021 - 21:11
 0
Gọọmenti Anambra eguzobela òtù ọrụ pụrụ iche maka nsogbu dị n'etiti Omor na Umumbo

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ bụ ụkwụ ka e ji achọ ihe dara mmiri, ma sịkwa na ọ na-abụ e gbuo àhàmà, a bụghị ya n'ukwu, o puchie.

N'iji chọpụta ebe mmiri siri wee bàá òpì ụgbọgụrụ, gọọmenti steeti Anambra eguzobela òtù nnyocha pụrụ iche iji nyochaa, chọpụta, ma lebà anya n'ihe bụ isi sekpụ ntị nà ihe ọ bụ ya bùtèrè nsogbu ahụ na-adapụta n'etiti obodo Omor na Ụmụmbo, dị n'okpuru ọchịchị Ayamelum.

Òtù ahụ e guzobèrè n'Awka na nso nso a bụ nke e nyèkwara ọrụ ịtụpụta usoro kacha mma a ga-esi weta ya bụ nsogbu n'isi njedobe kpamkpam, ma gbochiekwa ya maọbụ ụdị nsogbu ọzọ dị etu ahụ ịdapụtakwa maọbụ selitekwa isi ọzọ n'ọdịnihu na mpaghara ebe ọbụla n'ime steeti ahụ.

Ya bụ òtù ọrụ, bụ nke mmadụ iri mejupụtara, nwèrè Ọkammụta Solomon Ekwenze dịka onyeisi oche ya, ma nwekwazie Dọkịta Emma Ude-Akpeh (nke ụlọọrụ ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ) dịka ode akwụkwọ ya.

Ndị ọzọ so n'òtù ahụ gụnyèrè Maazị Uchenna Okafor (bụ ọka okwu ụlọ omebe iwu steeti ahụ); Maazị Vincent Ofumelu (bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Oyi na Ayamelum n'ụlọ nnọchianya etiti); Igwe Benjamin Okeji (bụ onyeisi otu jikọtara ndị igwe n'okpuru ọchịchị Ayamelum ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Ọmasị). Ndị ọzọ gụnyère Maazị Paul Odenigbo; Ụkọchukwu John Manafa; Maazị Bonny Emengini; na Maazị Tony Iwoba.

N'okwu ya oge ọ na-egùzobe òtù ahụ n'aha Gọvanọ Willie Obianọ, osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwara na ọ bụ ihe na-echu ọchịchị steeti ahụ ụra oge ọbụla, bụ ịhụ na e nwere udo, ịdịnotu, na ezi nchekwa ndụ na akụnụba n'ime steeti.

Ọ dụkwazịrị ndị òtù ọrụ ahụ ka ha gbasie mbọ ike, rụọ ọrụ ahụ a hànyèrè ha n'aka dịka o siri kwesi, ma wetekwara gọọmenti nchọpụta ha, ozi, nakwa ihe ndị ọzọ dị oke mkpà a chọrọ, iji weta ya bụ nsogbu n'isi njedobe n'oge adịghị anya.

Na nzaghachi n'aha ndị òtù ya, onyeisi òtù ọrụ ahụ, bụ Ọkammụta Ekwenze kwèrè nkwà na ha ga-agba mbọ etu o kwesiri iji mezùpụta ya bụ ebumnobi e jiri guzobe òtù ahụ, ọbụnadị dịka ọ dụrụ obodo abụọ ahụ ka ha makụọ ma gbasoo udo ma nyekwara òtù ọrụ ahụ aka iweta ya bụ nsogbu n'isi njedobe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.