Korona: Ọkammụta Sam Ụzọchukwu Ekèéla Ụmụnwaanyị Ego n'Ebenator

May 6, 2020 - 20:37
Jan 22, 2021 - 21:18
 0
Korona: Ọkammụta Sam Ụzọchukwu Ekèéla Ụmụnwaanyị Ego n'Ebenator

Izunna Okafor, Awka

N'iji belata mmetụta nke ọrịa nje korona n'ahụ ụmụ mmadụ, Ọkammụta Sam Ụzọchukwu ekesàála ego ruru otu narị puku naịra na iri ise nyegara ụmụnwaanyị Ụmụnwunne dị n'Ebenator, n'okpuru ọchịchị ime obodo Nnewi South nke steeti Anambra.

N'okwu ya na memme ikesa ego ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ezinụlọ be ya, Ọkammụta Ụzọchukwu gwara ụmụnwaanyị ahụ na ebumnobi nke ahụ bụ iji gbaa ha ume n'ime oge a n'ihi óké ihe isi ike nke ọrịa nje korona wètàrà, ma mekwa ka ha mara na a kà bùkwà ọdịmma ha n'obi, na-agbanyeghị na ya bụ ọrịa metụtara ma onye ukwu ma onye nta n'ụzọ dị iche iche.

O chetaara ha na ụdị ajọ ọrịa 'ozuruụwaọnụ' dị etu ahụ adapụtabụọla na mgbe gara aga, ma mechaa, gafee; o wee kwe ha nkwa, nyekwazie ha owuwe anya na ọrịa korona ga-esikwa etu ahụ gafee ma bụrụkwa ihe akụkọ n'oge adịghị anya.

Ọ kpọkùzịrị ma dụọ ha ọdụ ka onye ọbụla gbaa mbọ na-edebe, na-agbaso, ma na-erube isi nye ntụziaka niile gọọmenti na ndị ọkacha mara n'ihe gbasaara ahụ ike nyere, dịka ụzọ kacha mma isi gbanahị ibute maọbụ mgbasa ọrịa ahụ, bụ nke gụnyere: ịkwọ aka oge niile, ikpuchi imi na ọnụ ha, izèrè mmetụkọrịta ahụ, nakwa izèrè ebe ndị mmadụ kwụkọjuru.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu n'aha ụmụnwaanyị ibe ha, ụfọdụ n'ime ndị soro keta òkè n'ego ahụ ụbọchị ahụ, nke gụnyere Oriakụ Uchenna Ebubedike na Oriakụ Felicia Ezenagụ kelere Ọkammụta Ụzọchukwu maka ụdị nchèta na ọrụ ọma dị etu ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji.

A nọrọ na mmemme ahụ rie oriri, ebe ụmụnwaanyị ahụ gụkwara ma yọrịa egwu ọñụ na egwu otuto dị iche iche n'igosipụta etu obi dị ha oke ụbọchị ahụ.

Ụfọdụ ndị ọzọ, bụ ụmụafọ Ebenator nyegoro aka n'ụzọ dị iche iche n'ibelata mmetụta nke ihe isi ike ọrịa korona a wètàrà n'ahụ ụmụ mmadụ gụnyere: Maazị Gilbert Ezenagu (onye nyere gọọmenti otu nde Naịra, ma kesàkwara ụmụnwaanyị ji na àkpà osikapa); Ernest Orachiri (onye nyere obodo ahụ otu narị puku naịra, ma kèé àkpà osikapa); Maazị David Ndoeche (onye nyere ụmụafọ obodo ahụ otu narị puku naịra, ma kekwa akpa osikapa); Maazị Chukwuka Ezeh (onye nyere otu narị puku naịra na iri ise); Maazị Osita Imoh, Maazị Sunday Umeh, na Maazị Sunday Agwuncha (bụkwa ndị kegasịrị akpa osikapa).

N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anthony Okechukwu kèlèrè ndị ahụ maka ntụnye ha na enyemaka ha dị iche iche, ma kpekwa ka Chineke gọziekwa ha n'uju maka inyeritara ibe ha aka n'ime oge ihe isi ike a. Ọ kpọkuzịkwara onye ọbụla ka ọ kpachapụ anya nke ọma ịhụ na ọ na-erube isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti nyere, iji zeere ibute ọrịa ahụ.

Otu onye n'ime ndị ntorobia obodo ahụ, bụ Chidiebere Ojiego kèlèkwara ndị ahụ maka nkwàdo ha dị iche iche, ma kpọkuokwa ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha ñòmie nke ahụ, ma nyekwa aka n'ụdị n'ụdị ọbụla ha nwere ike.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.