Ọkụ Agbagbuola Mmadụ Ise n'Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Anambra

Apr 17, 2022 - 17:42
 0
Ọkụ Agbagbuola Mmadụ Ise n'Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nnukwu ihe anyammiri dapụtara na nsonso a, dịka ọkụ gbagburu mmadụ ise n'ajọ ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti Anambra.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ n'ime steeti Anambra, bụ DRC Margaret B. Onabe siri kọwaa, ihe mberede a bụ nke mere ka o jiri ọkara gata elekere isii nke ụtụtụ ụbọchị Wenezdee.

O mere ka a mara na ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara na mpaghara Nawfia, nke okporoụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha gaa Enugu, ma bụrụkwa nke metụtara ụgbọala abụọ na mmadụ ise.

Dịka o siri kọwaa, ndị ọnọmgbeomere kwuru na otu nwoke bu ụgbọala Bọọsụ nọ na nnukwu ọsọ, ụgbọala ya wee pụnahị ya n'aka, nke mezịrị ka o jiri oke ọsọ ahụ wee gbwakwuru ma si n'azụ suo ụgbọala Toyota Highlander na-agara onwe ya n'ihu, ụgbọala abụọ ahụ wee binwuru ọkụ ozigbo, nke na ọkụ ahụ gbagidere, ma gbagbuo mmadụ niile ahụ nọ n'ụgbọala ahụ (nke gụnyere ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị atọ).

O kwuru na ndị ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti ahụ wụchàrà ebe ahụ ozigbo ozi ruru ha ntị, wee gbanyụọ ọkụ ahụ, mana tupu mgbe ahụ, na ihe emebichaala, n'ihi na ọkụ agbapịala mmadụ niile ahụ nọ n'ụgbọala ahụ.

O kwukwazịrị na ndị ọrụ FRSC sitere Awka gbààrà gaa ebe ahụ ozigbo ha nwetere ya bụ ozi; ma kọwakwazie na ha nyere aka ịhụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu nke ya banyere ihe ọdachi ahụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi katọrọ etu ụfọdụ ndị na-anya ụgbọala si agba oke ọsọ n'okporoụzọ dịka à gà-asị na o nwere ebe ha kobere ndụ ha. 

Dịka ọ na-adụ ndị na-anya ihe ọnyịnya ọdụ ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, CC Irelewuyi kasizịkwa ezinụlọ ndị nke ahụ nwụrụ n'ihe mberede ahụ obi, ma kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụobi ha ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484