Gọọmenti Anambra Ekwela Nkwa Ibuso Nsogbu Gburugburu Agha

Apr 15, 2022 - 22:17
 0
Gọọmenti Anambra Ekwela Nkwa Ibuso Nsogbu Gburugburu Agha

Gọọmenti steeti Anambra ekwuola na ọ wàtàrà ọgọdọ ibusò ajọ nsogbu ọnọdụ gburugburu na-eme mkpamkpa n'ebe dị icheiche na steeti ahụ agha, iji wèta ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà.

Maazị Felix Odumegwu, bụ Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ bụ ya kwupụtara nke a n'okwu ya na mmemme pụrụ iche ọchịchị steeti ahụ chịkọbara na nsonso a site na njikọaka ụlọọrụ ‘Nigerian  Erosion  and Watershed Management Project (NEWMAP)’, bụ nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ya bụ mmemme bụ nke dọtara ndị sitere steeti iri abụọ na atọ, tinyere ndị sitere mba ofesi, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee lebà anya n'ọrụ NEWMAP na mgbataọsọ ha n'ebe dị icheiche e nwere nsogbu gburugburu.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Maazị Odimegwu kwuru na ọchịchị Soludo  dị njikere iji atụmatụ bụ ịgbà wee memilaa nsogbu ajọ ọnọdụ gburugburu na mkpamkpa idei mmiri, ma mee ka ebe niile chawapụ.

O kwuru na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ na-enwekarị nsogbu gburugburu, ọkachasị mbize; ma kwukwa na e nwere mbize narị iteghete na iri ise dị na steeti ahụ, mana ọ bụ naanị iri na atọ n'ime ya ka ụlọọrụ NEWMAP, ma kwuo na ọ bụ ihe mwute na a na-emefu ọtụtụ ego n'ihe gbasaara nsogbu gburugburu.

O kwupụtakwara ezi olileanya o nwere na atụmatụ dị icheiche a na-eweputa ga-enye aka ibelata nsogbu gburgburu ahụ. 

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, osote Gọvanọ Steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim nabàtàrà ndị ahụ n'aha Gọvanọ Soludo, ma kwe nkwa na steeti ahụ dị njikere ịga n'ihu na-ejikọ aka ọnụ, ha na ụlọọrụ ahụ.

Otu onye n'ime ndị ritere uru n'atụmatụ ọrụ NEWMAP ahụ, bụ Oriakụ Florence Anagbogu, onye bụ nwaanyị ajadụ kọrọ akụkọ ọgbụgbaama banyere etu o siri chee na ọ bụ egwuregwu oge ha gbataara ya ọsọ enyemaka, wee ruo mgbe a rụchara ya bụ ọrụ.

Ya bụ mmemme dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; onyeisi ndị ọrụ nye gọvanọ Soludo, bụ Maazị Ernest Ezeajughi, tinyere ndị kọmishọna sitere steeti dị icheiche na-esonye n'amụmà ahụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484