Ndi na-achi Nigeria ezugbuole Nigeria n’oshi

Ndi na-achi Nigeria ezugbuole Nigeria n’oshi

Jan 24, 2013 - 05:30
Jan 20, 2021 - 05:33
 0

Jonathan na-ekwu na obi dị ndị Nigeria ụtọ maka ọnọdụ ọkụ latrik. Onye isi ala Nigeria, Goodluck Jonathan, kwuru okwu na CNN ụnyaa bụ abalị 23 nke ọnwa Jenụwarị. Nwanyị onye nta akụkọ CNN, Christiane Amanpour, gbara Jonathan ajụjụ ọnụ gbasara ọchịchị ya, na ọnọdụ udo na nchekwa n’ala Nigeria.

Jonathan kwuru na ndị otu Boko Haram bụ nanị ihe aka mgba chere Nigeria n’ihu. Ọ kpọrọ oku ka ụwa niile nyere gọọmenti Nigeria aka n’ibusa ndị Boko Haram agha.

Christiane jụrụ Jonathan maka nkwa o kwere n’afọ atọ gara aga, na-asị na gọọmenti ga-agba mbọ maka ime ka ọkụ latrik na-adị mgbe niile. Jonathan gwara Christiane ka o jee jụọ ndị Nigeria bi ebe dịka Lagos na Abuja. N’ọ ga-achọpụta n’afọ juru ndị Nigeria maka mbọ gọọmenti ya na-agba maka ime ka ọkụ na-adị.

Mgbe ndị Igbo Radio kpọrọ ndị niile anyị ma bi na mpaghara Lagos dị ịche ịche, anyị chọpụtara na ọkụ anaghị adị otu Jonathan siri kwu.

Christiane jụkwara Jonathan maka ndị minista ala Nigeria na-ezugbe Nigeria n’oshi. Maka ndị na-ezugide zuo ma mmanụ akụ chi nyere. Ọ jụkwara ya maka nrụrụ aka ndị ọrụ gọọmentị na-eme. Mana Jonathan azaghị ya ọfụma.

Ọ jụrụ Jonathan ihe mere na ụmụ afọ Nigeria na-anwụ n’aka ndị uwe ojii, karịrị ndị na-anwụ site n’aka ndị Boko Haram. Jonathan azaghị ajụjụ a ọfụma.

Pịtụ mkpụrụ aka kọmputa gị ebe a, ma ị chọọ ịle ajụjụ ọnụ a na CNN.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.