NDLEA Ejidela Nwoke Loro Ọgwụike n'Abụja, Jidekwa Ụmụakwụkwọ Mahadum Ise Maka Ọgwụike

Dec 10, 2021 - 20:58
 0
NDLEA Ejidela Nwoke Loro Ọgwụike n'Abụja, Jidekwa Ụmụakwụkwọ Mahadum Ise Maka Ọgwụike


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụ ike n'ala Nigeria, bụ 'National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA' ejidela otu nwoke mụrụ ụmụ atọ maka ilo àkpà ọgwụike koken ruru iri iteghete na isii, wee na-achọ isi ala Nigeria felie, ka ọ gaa mba Spain.

Nwoke ahụ, bụ Maazị Gabriel Anthony Patrick ka e kwuru na ọ gbara ahọ iri anọ na anọ, ma bụrụkwa onye e jidere n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa Nnamdị Azikiwe dị n'Abuja, bụkwazị ebe ọ nọrọ wee nyụpụtasịa ọgwụike ahụ o loro, oge ndị NDLEA na-agba ya ajụjụọnụ.

Maazị Femi Babafemi, bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA dị n'Abụja bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụrụ ụbọchị ụka, ma bụrụkwa nke o sitere na ya wee kọwaa na nwoke ahụ bụ onye obodo Nike dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Enugu North' nke steeti Enugu.

O kwuru na nwoke ahụ agbapụbụọala, gbaga na mba Germany n'ahọ 1996 ebe ọ gara zoo wee ruo ahọ abụọ oge a na-achụ ya; o wee mechaa si ebe ahụ gbapụ, gaa mba Spain n'ahọ 1999, bụzị ebe e nyere ya ọnọdụ ibi ebi ma na-arụkwazị ọrụ dịka onye na-anyà ụgbọala n'otu ụlọọrụ na-emepụta erimeri na mbà a. Ọ sịkwa na nwoke ahụ kọọrọ ha na ọ bàtàrà Nigeria n'abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba ka o ree ákwà na akụkụ ụgbọala dị icheiche o bulatara na Lagos, ma kọgasịkwa akụkọ ndị ọzọ enweghị isi na ọdụ banyere etu o siri nwee njọ ahịa n'irecha ihe ndị ahụ ọ batara ire maka na ndị mmadụ anaghị ekweru ya ọnụ ego ole o goro ya; etu o siri ga hụ ezinụlọ ya na etu o siri chọọ ịlaghachi mba Spain ka ọ ga malite ọrụ n'ihi na oge ezumike e nyere ya agwụla.

Ọ sịkwazị na njọ ahịa ahụ o nwere na ihe ndị ọzọ ọ gabigara mezịrị ya ka o kwete ịrụ ọrụ mmadụ nyere ya, bụ ọrụ isi ala Nigeria bugotere ya ọgwụike koken ahọ na mba Spain, bụkwa nke a ga-akwụ ya ego dị 1,500 Euros ma o bute ya bụ ọgwụike. Ọ sịkwazị na ọ gara Onitsha dị na steeti Anambra, ebe a bịara kpọrọ ya nabalị wee ga nye ya akpa ọgwụike ahụ ka o loo n'afọ ya tupu ọ gaba Abuja n'echi ya maka ịba ụgbọelu na-aga mba Madrid.

Ọ bụzị oge ndị ọrụ NDLEA na-eme nnyocha ahụ ha na-emekarị tupu ụgbọelu efelie ka ha chọpụtara ma nwụchie ya bụ nwoke, ma kpọrọ ya gaa n'ụlọọrụ ha; o wee nyụpụtaba ọgwụike niile ahụ o loro n'afọ ya.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị ọrụ NDLEA nọkwara n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa 'Murtala Muhammed International Airport' dị na Lagos wee nwụchie otu nwoke, bụ Okorie Godwin Onyeribe ka ọ na-achọ ibu ọgwụike cannabis arọ ya ruru 21.85kg wee gaa mba London, UK. Akụkọ kọrọ na ya bụ nwoke zoro ya bụ ọgwụike n'ime ihe e ji esi nri, ma bụrụkwa onye e jidere oge a na-eme nnyocha n'ọdụ ụgbọelu ahụ.

N'otu aka ahụ, e jidekwàrà ụmụakwụkwọ mahadum ise na-agụ na mahadum 'American University of Nigeria, Yola' dị na steeti Adamawa na mahadum 'University of Maiduguri' dị na steeti Borno, maka itinye aka n'ịtụ mgbere ọgwụike. Ọ bụkwa site na mpaghara steeti dị icheiche ka e siri nwụchie ndị ahụ, mebezie nnyocha wee chọpụta na ha bụ ụmụakwụkwọ mahadum.

Mmadụ abụọ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ, bụ Emmanuel Thlama na Jonah Joshua bụ ndị e nwudere ka ji ọgwụike cannabis arọ ya ruru 16.750kg oge ndị ọrụ NDLEA wakporo ma mee nnyocha n'ebeobibi dị na ncherịtaihu 'Gate 4' nke mahadum 'University of Maiduguri'.
 
Mmadụ abụọ ndị ọzọ, bụ Ekene Asher; Daniel Alkali na Emmanuel Smooth, bụ ụmụakwụkwọ 'American University of Nigeria, Yola' ma bụrụkwa ndị e jidere oge e wetèchaara ha ọgwụike 'Loud' otu onye n'ime ha, bụ Ekene tụrụ mmadụ ka o butere ha ka ha wee chaa anya.

N'ọrụ ha na mpaghara steeti dị icheiche, ndị NDLEA nwudezịkwara ọtụtụ ndị mmadụ dị icheiche na-etinye aka n'ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụike, nke gụnyere Matthew Donuwe na Friday Nborgwu ha jidere na steeti Ondo ma nweta ọgwụike cannabis arọ ya ruru 2000.6kg n'aka ha; ọgwụike cannabis sativa arọ ya ruru 608.40kg ha nwetara n'Ibadan dị na steeti Ọyọ, ya na ndị aka ha dị na ya, bụ Benson Uzoka, 46; Kafayat Adeyemi Uzoka, 40; Ndidi Uzoka, 39 na Christopher Uzoka, 42; ọgwụike cannabis arọ ya ruru 22kg ha nwetara n'aka Praise Emmanuel na Aminu Aliyu na steeti Kano; tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ha jidere na steeti Ogun, Delta, Rivers, Niger na Taraba.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484