Nwata Akwụkwọ Etigbuola Onyenkuzi ya na Delta

Dec 12, 2021 - 21:32
 0
Nwata Akwụkwọ Etigbuola Onyenkuzi ya na Delta


Otu nwata akwụkwọ nọ n’ogo Siniọ Sekondịrị agba nke atọ (SSS3) n’otu ụlọakwụkwọ nke onwe dị n’Abraka, okpuru ọchịchị Ethiope East na Steeti Delta, etigbuola onyenkuzi ya.

Nwaakwụkwọ ahụ aha ya bụ Michael Ogbefe ka e kwuru na o tiri onye nkuzi ahụ aha ya bụ Joseph Ossai ihe nke mere ka ọbara gbaba ya n’imi na ọnụ. E burụ ya gaa ụlọogwu nke onwe ma sikwa ebe ahụ buru ya gaa ụlọọgwụ ọha na eze, ebe a nọrọ kwuo na ọ nwụọla.

Tupu ọ nwụọ, Ossai bụ onyenkwuzi na-ahụ maka ihe ọmụmụ “Agricultural Science” na “Biology” n’ụlọakwụkwọ ahụ. Nsogbu pụtara oge onyenkuzi ahụ pịachara nwanne nwaanyi nwaakwụkwọ ahụ aha ya bụ Promise ụtali.

N’ihi ya, Ogbefe ji iwe si n’ụlọakwụkwọ ahụ pụọ ma mgbe ọ laghachiri azụ, ọ bara n’ọnụụlọ ndịnkuzi (staff room), manye onyenkuzi ahụ ogụ. Otu o sila dị, ụfọdụ ndi mmadụ kwuru na ọ gara ụlọ weta ọgwụ tupu ọ manye onyenkuzi ahụ ọgụ; onye e kwuru na o korokpuru ka o tikatara ya ihe.

Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ha na ndị mmadụ na steeti ahu, DSP Bright Edafe, oge a kpọtụụrụ ya kwuru na ya bụ ihe mere eme n’ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484