N'Agụata, E Nyela Ụmụnwaanyị Na Ndị Ntorobịa Ọzụzụ n'Ọrụaka, Nye Ha Nkwàdo

Dec 10, 2021 - 20:45
 0
N'Agụata, E Nyela Ụmụnwaanyị Na Ndị Ntorobịa Ọzụzụ n'Ọrụaka, Nye Ha Nkwàdo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ọñụ dara na nsonso a n'obodo dị icheiche dị n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra, dịka e nyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa dị icheiche ọzụzụ n'ụdị ọrụaka dịgasị icheiche, ma nyekwa ha nkwàdo na akụrụngwa kwesiri ekwesi iji malite ịrụ ihe ha mụtara n'ọzụzụ ahụ.

Ya bụ inye ọzụzụ na nkwàdo bụ nke e mere site n'aka onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Agụata n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Chukwuma Umeọjị, site na njikọaka ụlọọrụ 'African Union Development Agency, AUDA-NEPAD Nigeria Presidency' ma bụrụkwa nke e sitere na ya nye ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa gafere narị n'ọnụọgụgụ ọzụzụ n'ọrụaka dị icheiche, nke gụnyere ịchọmma, ighe ihe oghighe na imepụta ihe oriri dị icheiche, tinyere uzoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ ICT.

Ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa ahụ sonyere n'ọzụzụ ahụ bụ ndị a gụtara site n'obodo iri na anọ mejupụtara mpaghara okpuruọchịchị ahụ, ma bụrụkwa ndị e hiri asaa n'anya wee họpụta, dịka ọrụaka dị icheiche ha chọrọ ịmụ siri dị.

N'okwu ya banyere nke ahụ, nwa amadi ahụ na, nwa amadi ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Agụata n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Chukwuma Umeọjị kọwara na ebumnobi nke ahụ bụ iji belata nsogbu enweghị ọrụ dị n'ala Nigeria ugbua site n'ịkwalite ọrụaka dị icheiche; ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị ahụ ka were mmụta ha nwetara n'ọzụzụ ahụ na akụrụngwa dị icheiche e bunyere ha wee bàárá onwe ha uru, ma bụrụkwa ndị kwụụrụ onwe ha.
 
Na ntụnye nke ya, otu onye n'ime ndị soro wee nye ọzụzụ ahụ, bụ Oriakụ Beatrice Nwoye kọwàrà na ya bụ ọzụzụ wèrè mkpụrụ ụbọchị anọ, ma gosipụtakwa obiụtọ ya banyere etu ndị ahụ siri dị uchu bke ukwu wee mụta ihe niile dị icheiche a kụziiri ha ngwangwa n'ime mkpụrụ ụbọchị anọ ahụ. 

Ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha ghara ịgharịpụ onye na òtù chịkọbara ya bụ ọzụzụ maọbụ ree akụrụngwa ahụ ebunyeresiri ha, kama ka ha jiri ya mepụta ihe a hụrụ anya, n'ihi na ọ bụ naanị site n'ụzọ dị etu ahụ ka hụ pụrụ isi kwụghachi ndị chịkọbara ya bụ ọzụzụ.

N'okwu ha n'otu n'otu n'aha ndị ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ, nke gụnyere obere nwaada Oluebube Nwosu, Oriakụ Georgina Mbanefo na Maazị John-Paul Obi kelere ndị chịkọbara ya bụ ọmụmụ ọrụaka, kelelekwa ndị kụziiri ha ọrụaka dị icheiche ha mụrụ maka obiumeala ha, bụkwazị nke mere ka ha nwee ike ịmụta ya bụ ihe a kụziiri ha nke ọma.

Ha nyekwara ekele n'ụzọ pụrụ iche banyere nkwàdo e nyere ha na akụrụngwa dị icheiche e bunyesiri ha, ma kwe nkwa iji ha mee ihe e zubeere ha, iji sikwa n'ụzọ dị etu ahụ bàárá onwe ha na obodo ha uru, ma chụkwa ụbịam ọsọ na ndụ ha, n'ezinụlọ ha dị icheiche na n'obodo ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484