Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndì Òtu Nzuzo 85 Na Onye Uwe Ojii Adigboloja

Aug 21, 2019 - 06:00
Jan 21, 2021 - 21:57
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndì Òtu Nzuzo 85 Na Onye Uwe Ojii Adigboloja

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma a gbaa bute, a kwachie, chere ọzọ; ma sịkwa na a naghị aka àkà eje nta agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba ya.

Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa mmadụ iri asatọ na ise a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị na-akwaso nwaanyị iko n'ike nakwa ndị na-etinye aka n'ihe ndị ọzọ dị iche iche na-ewèta ala adịghị mma.

Ọ bụ onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị John Abang mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ n'isi ụlọ ọrụ ya dị n'Amawbịa.

O mere ka a mara na ọ bụ n'ime mkpụrụ ụbọchị asatọ (malite n'abalị iri wee ruo abalị iri na iteghete nke ọnwa Ọgọstụ) ka a nwụchikọrọ ndị ahụ, ma kwuo na nke ahụ bụ nnọọ ihe kwere omume, n'ihi otu e sigoro wee lebàgharịa anya ma nwògharịa ihe ụfọdụ n'usoro ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche si arụ ọrụ ha na steeti ahụ, ọ kachasị ndị òtù ọrụ 'Puff Adder' na ndị 'Operation Kpochapụ'.

Maazị Abang gara n'ihu kọwaa na n'ime mmadụ iri na asatọ ahụ a nwụchikọrọ, a tọhapụrụ mmadụ iri atọ na isii oge e mere nnyocha ha, ma kwuo na a ka na-eme nnyòcha banyere mmadụ iri na iteghete, tinye mmadụ iri n'okpuru nlekọta ndị uwe maka ahọ ha nọ, ma kpụpụ mmadụ iri ndị ọzọ ụlọikpe ebe a ga-ejizị usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

Dịka o siri kwuo, mmadụ iri na isii n'ime ndị ahụ, bụkwa ndị sitere na steeti dị iche-iche dị mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ kà a nwụchikọrọ n'Oko dị n'okpuru ọchịchị Orumba North ebe ha nọ wee nọ wee na-edu onwe ha n'iyi ọrụ ma na-emekwa ihe ọgbụgba ndụ ịbanye n'otu nzuzo Aiye. Ma ndị ọzọ bụ ndị a nwụchikọrọ site n'obodo dị iche-iche n‘ime steeti ahụ, nke gụnyere Awka, Ogidi, Ịgbarịam, Obosi, Ọnịtsha, na mpaghara ebe ndị ọzọ.

Ihe ndị e nwekọtara site n'aka ndị ahụ gụnyèrè ọtụtụ mma òbèjiri na mma agha, okpu ndị otu nzuzo, ihe e ji akpọ ntụ ọgwụ ike cocaine, anyike atọ, agara iwe, nsụnsụ egbe atọ mgbọ dị n'ime ya, mgbọ egbe iri na abụọ dị ndụ, na àkpà anwụrụ ike jupùtara na ya, bụ nke a na-enyo enyo na ọ bụ ọgwụ ike Cannabis Sativa.

Ọtụtụ n'ime ndị ahụ kwetara ma kwuo n'eziokwu na ha mere ihe dị otu ahụ, ma rịọ ka a gbaghàra ha, ebe ụfọdụ n'ime ha kwùrù na aka ha dị ọcha.

N'akụkọ dịkwa ka ibe ya, ndị uwe ojii ahụ kpụgharịkwara otu onye uwe ojii adịgboloja, aha ya bụ Hassan Abuka gbara ahọ iri atọ na atọ, onye kwara ma yìri ákwà onye nọ n'ọkwa DSP n'ọrụ uwe ojii, ma bụrụkwa onye e kwuru na ya na onye òtù ya, bụ Maazị Ismaila Ahamed sitere Otukpọ na steeti Benue zurù ụgbọala mmadụ ma buru na-agafé n'Ihiala, ebe aka ndị uwe ojii nọrọ wee kpàra ha.

Otu ọ dị, ya bụ onye uwe ojii, bụkwa onye sitere Otukpọ na steeti Benue kọwara nke ahụ dịka ebubo ụgha, ma kwuo na ya zụtara ụgbọala ahụ n'aka mmadụ, ma nwekwa akwụkwọ na ihe akaebe dị iche iche o jiri wee zụọ ya, n'amaghị na ọ bụ ụgbọala e zùrù ezu dịka e si ekwu; ma ọ gwara nwanne ya nwoke ahụ bụ Ismaila ka o nyere ya aka na-ebugharị ya, we ruo mgbe ya onwe ya ga-amụta otu e si anyà.

O kwuru na ya onwe ya bụ onye uwe ojii n'oge gara aga, mana a chụrụ ya n'ọrụ n'ihi na mgbọ egbe ya tụrụ ma gbagbuo onye uwe ojii onye òtù ya n'amaghị ama, oge ha na ndị omekoome na-akwarịta mgbọ; mana kemgbe ahụ, o nweghịzị ihe ọ na-arụ iji lekọta ezinaụlọ ya na agụmakwụkwọ ụmụ ya anya, bụzị nke mere o jiri ga kwáá ákwà ndị uwe ojii, ma were ya sòro ụfọdụ ndị uwe ojii ndị òtù ha na-aga ọrụ oge ọbụla ọrụ dapụtàrà, bụkwa nke ọ sị na ọ bụ ya ka o megidere wee rụta ego o jiri goo ụgbọala Toyota Camry ahụ na Lagosi.

Dịka ọ gara n'ihu kọwaa, ihe ahụ na Lagos ka o mere, ma ọ gbazịkwara ya ngharị ka otu nwoke ọzọ sitere Anambra ya amaghị onye ọ bụ, bịara n'ogige ndị uwe ojii ebe ahụ a kpọchiri ha, ma na-ebokwa ya ebubo ọzọ, bụ nke ya amaghị ihe ọbụla maka ya, sị na ọ bụ ya na onye òtù ya ahụ jiri egbe wee pụnara ya ụgbọala ya; ebubo wee karịzie ya ahụ.

N'akụkụ nke ya, ya bụ nwoke sịrị na a pụnaara ya ụgbọala, bụ Maazị Nọnso Chinaecherem mere ka a mara na ọ bụ n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Julaị ahọ a, n'elekere iteghete nke anyasị ka mmadụ abụọ ahụ wakpòrò ya na mpaghara ụzọ Rọban dị n'Awka, jiri egbe pụnara ya ụgbọala ya n'ike, ma kwuokwa na ya chetara ihu ndị ahụ nke ọma, nke mezịrị o ji na-ekwusi ike na ọ bụ ya bụ nwa amadi na onye òtù ya mere ihe ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, ndị uwe ojii ka na-eme nnyocha bànyere okwu ahụ niile, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe ebe a ga-anọ wee kpee ha ikpe n'ótù n'ótù.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.