Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndị Ohi Ọzọ n'Awka

Jul 10, 2019 - 21:59
Jan 21, 2021 - 22:00
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndị Ohi Ọzọ n'Awka

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Igbo sị na nwata a na-agwọ ibì ọ na-eto afọ, ị mara na o nwèrè ihe ọ tọbàrà n'ajọ ọfịa. O wee bụrụ ya, na ka ọ dị taa, na ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọla ndị òtù ohi ọzọ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, na-agbanyeghị mbọ dị iche-iche ọchịchị steeti ahụ gbàgòrò imemìla ohi na arụrụ ala na steeti.

Dịka ozi isi ọchịchị ndị uwe ojii na steeti ahụ kụpụrụ nso-nso a siri kọwaa, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ maazị Harụna Mọhammed sìrì kọwaa; ndị oji akpa eli ozu ahụ na-aga akpàkasị ụlọ ndị mmadụ, ma na-ezu ha ohi.

Ozi ahụ mere ka a mara na ọ bụ site n'ịkwụsị ụgbọala na inyòcha ndị mmadụ, bụ nke ndị uwe ojii na-eme n'okporo ụzọ Ifitè Awka, ka e jiri nwụchikọọ otu nwaokorobịa, bụ Elendu Wisdom, gbara ahọ iri abụọ na isii, ma mgbe ha nyòchàrà àkpà ya, ha wee hụ akụrụngwa na ngwaọrụ dị iche-iche o ji akpàkasị ụlọ ndị mmadụ, tinyere nkwụ ọkụ, anwụrụ, ihe nri na ihe ndị ọzọ dị iche-iche.

Mgbe a gbàrà ya ajụjụ nnyòcha, nwata nwoke ahụ kwètàrà hoohaa ma were ọnụ ya kwuo na ya agaalarị kpàkaa ma zuo ohi n'ótù ụlọ ahịa dị n'Ifitè ahụ; ma mgbe ndị uwe ojii gàrùrù ebe ahụ, ha hụrụ ya bụ ụlọ ahịa na onye nwe ya, bụ oriakụ Chinwe Madụkegbu, onye kwuru na ọnụ ego ihe e zuru ezu ebe ahụ rùrù puku Naịra iri asaa na ise.

Dịka ozi ahụ gara n'ihu kọwaa, ya bụ nwa amadi bụ onye obodo Asa dị n'okpuru ọchịchị 'Ukwa West' nke steeti Abịa, ma biri n'Awkuzụ dị n'okpuru ọchịchị Oyi nke steeti Anambra, ebe ọ nọ arụ ọrụ aka dịka onye na-ama ihe ọmụma 'Plaster of Paris' (POP), ma bụrụkwa onye e sì n'ụlọ mkpọrọ wee tọhapụ nso-nso a maka arụrụ ala ọ rụrụ n'oge mbụ, tupu ọ bịa rụọ nke a.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, ndị uwe ojii nọ na mpaghara Awada jidekwàrà otu nwaokorobịa ọzọ, bụ maazị Chika Udeze gbakwara ahọ iri abụọ na isii, onye e kwùrù na ọ gàrà kpàkaa ụlọ otu nwoke, bụ maazị Ifeanyi Igwe n'Awada ma zukọsịa ọtụtụ ihe, larie.

Ya bụ ajọ nkịta ji isi anya ọkụ ka e kwùrù na o kwetela n'eziokwu na ya kụrụ ya bụ akụmakụ ma zuokwa ohi n'ebe ọzọ dị iche-iche na mpaghara, ma rịọkwa ka a gbaghàra ya.

A napụtasịkwala ya ihe ndị ahụ niile o zùrù n'ohi, ebe nnyocha ka na-agazịkwa n'ihu ịchọpụtakwu bànyere ha abụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.