Ndị Uwe Ojii Anambra Anwụchikọọla Ndị Òmèkóòmè Karịrị Otu Narị

Mar 18, 2020 - 03:14
Jan 22, 2021 - 21:54
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Anwụchikọọla Ndị Òmèkóòmè Karịrị Otu Narị

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ bụrụ na a pịaghị ngwere ụtarị, ọ naghị ama na ọ gbà ọtọ, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-etiwu, ọ ka na-arịsịta, ị mara na ihe a na-etinwu agwụbeghị ebe o si apụta. N'ịgbaso nke a, ndị uwe ojii steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa mmadụ dị otu narị, iri abụọ na abụọ n'ọnụ ọgụgụ maka itinye aka na mpụ, arụrụala na omekoome ndị ọzọ dị iche iche.

Ịkpụgharị na ime ka ụwa mara banyere ndị a bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ndị uwe ojii dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke e mere site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed, n'aha onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang.

N'okwu ya oge ọ na-eme nke ahụ, Maazị Mọhammed mèrè ka a mara na site na mkpesa e nwètàrà, na òtù ọrụ uwe ojii pụrụ iche a maara dịka
'Puff Adder' nakwa 'Special Anti Robbery Squad (SARS)' nọrọ n'abalị iteghete nke ọnwa Maachị a wee nwụchikọọ Maazị Angus Chukwebuka Nwankwọ (gbara ahọ iri atọ) na Maazị Chidiebere Omeyi (gbara ahọ iri abụọ) na Nanka, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Orumbra North.

Mmadụ abụọ ahụ, dịka o siri kọwaa, ghọgbùrù otu nwoke a kpọrọ Willswags site n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ 'Facebook', mee ya ka ọ chọrọ ha bịa Nanka n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febụwarị ahọ a, bụ ebe ha nọrọ wee nakọrọ ihe niile o jiri wee bịa, ma gbuokwa ya egbuo, buru ozu ya ga dọba n'otu ime ọhịa.
O kwuru na ndị ahụ kwètara na ha kụrụ ya bụ akụmakụ, ma durukwa ndị uwe ojii, ga gosi ha ebe ha dọbara ozu ya bụ nwoke.

N'ịga n'ihu, Maazị Mọhammed kpọpụtasịrị imirikiti ndị ọzọ aka ndị uwe ojii ahụ nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ, nke gụnyere: ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala n'ike, ndị oji egbe ezu, ndị otu nzuzo, ndị adịgboloja abụọ na-ebugharị onwe ya dịka onye ọrụ agha ala anyị; onye na-ebugharị ngwa ọgụ; nwata nwaagbọghọ ahụ mụrụ ma tụfuo nwa ọhụụ n'Oko.

N'ihe gbasaara nwa ọhụụ ahụ a tụfùrù n'Oko, Maazị Mọhammed kọwàra na nne ya bụ nwata a mụrụ ọhụụ sịrị na ihe mere o jiri tụfuo ya bụ na ya amaghịzị nwoke nke ọ bụ ya kpọmkwem tụbara ya ime nwa ahụ n'ezie, n'ihi ọnụọgụgụ ụmụnwoke riri ya ọkọmbọ n'oge ahụ.

O kwukwàra na nwata ahụ dị ndụ ma nọrọkwa n'ụlọ ahụike ugbua ebe ya na nne ya nọ ugbua anara ọgwụgwọ, n'ihi na ahụ esighịkwu ya onwe ya ike.

Ọ kọwara na mkpokọta ọnụọgụgụ ndị ha nwụchikọrọ dị mmadụ otu narị na iri abụọ na abụọ, mee ka a mara na a kpụpụla mmadụ iri abụọ na ise n'ime ha ụlọ ikpe, tọhapụ mmadụ iri atọ na anọ, ebe mmadụ iri isii na atọ ndị ọzọ bụ ndị a ka na-enyocha okwu ha ugbua, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ga ụlọ ikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee nyụchaa ha anya.

Ihe dị iche iche a napụtasịrị site n'aka ndị ahụ gụnyère: égbè karịrị iri na ise n'ọnụọgụgụ, mgbọ égbè karịrị puku abụọ n'ọnụọgụgụ, ụgbọala atọ, otu ọgbatumtum, anyike na mma agha karịrị iri abụọ, akụrụngwa e ji akpọ anwụrụ ike, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

O mere ka a mara na otu ihe mere ndị uwe oji steeti ahụ ji agawanye n'ihu n'ọrụ ha ma na-enwetawanye mmeri bụ n'ihi ezi mmekọrịta na njikọaka dị n'etiti ha na ụmụafọ na gọọmenti steeti Anambra, ya na ezi nkwado Gọvanọ Willie Obianọ na-enye ha.

O kwupụtazịkwàra ezi olileanya o nwèrè na site na ntuziaka ahụ onyeisi ndị uwe ojii n'ala Nigeria, bụ Maazị IGP Mọhammed Abụbakar Adamu nyèrè ka e wee ụfọdụ ndị mmadụ n'ọrụ ịbụ 'Special Constabulary' ndị ọrụ uwe ojii ga na-enyekwu aka n'ọtụtụ ụzọ pụrụ iche n'ịkwalite ọnọdụ nchekwa n'ime ime obodo dị iche iche n'ala Nigeria.

Ọ gakwazịrị n'ihu kpọkuo ndị Anambra ka ha jisie ike n'ịdọnyere ndị ọrụ nchekwa ukwù n'ọrụ ha, ọ kachasị site n'ịdị na-ewetàra ha mkpesa bànyere ọnọdụ ọbụla a na-enyo ènyò, n'ihi na ndị ọrụ nchekwa agaghị abụ ọnọ n'ụlọ mara ihe zụrụ n'ahịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.